Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Nke Abù 3:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. N'elu ihe-ndinam n'abali ka m'chọrọ onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya:Achọrọm ya, ma achọtaghm ya.

2. M'siri, Biko, ka m'bilie, jegharia n'obodo buruburu,N'amá nile na n'ebe nile sara mbara,Ka m'chọ onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya:Achọrọm ya, ma achọtaghm ya.

3. Ndi-nche ndi nējeghari n'obodo buruburu hurum:M'we si ha, Ùnu ahuwo onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya?

4. Ọ bu nání nwantī ka m'siri n'ebe ha nọ gabiga,Mb͕e m'chọtara onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya:Ejiderem ya, arakwaghm ya aka,Rue mb͕e m'mere ka ọ ba n'ulo nnem,Na n'ime-ulo nke nwayi turu imem.

5. Unu umu-ndinyom Jerusalem,Ejim nne-mb͕ada nile, ejikwam nne-ele ọhia nile, b͕a unu iyi,Unu akpọtela, unu eme-kwa-la ka ihu-n'anya teta, ma-ọli,Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ.

6. Ọnye bu nka nke nēsi n'ọzara arigota dika ogidi di iche iche nke anwuru-ọku,Nke anēsurere ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bú myrrh na frankincense,Site n'ihe nile egwere egwe nke onye-ahia?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Nke Abù 3