Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù-Ákwá 3:44-62 Bible Nso (IGBOB)

44. I werewo igwe-oji kpuchie Onwe-gi, ka ekpere-ayi we ghara igabiga.

45. Ihe azachapuru azachapu na ihe ajuru aju ka I nēme ayi n'etiti ndi nile di iche iche.

46. Ndi-iro-ayi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide ayi.

47. Oké egwu na olùlù eruwo ayi aru, itọb͕ọ-n'efu na ntipia.

48. Ọtutu iyi nke juputara na miri ka anyam nērùda, n'ihi ntipia nke ada ndim.

49. Anyam nāwusi dika miri, ọ dighi-eguzo kwa du, ghara ikwusi akwusi,

50. Rue mb͕e Jehova gēsi n'elu-igwe lepu anya, hu.

51. Anyam nēme nkpuru-obim ihe, n'ihi umu-ndinyom nile nke obodom.

52. Ndi bu ndi-irom n'efu achusiwo ntám ike dika nnunu.

53. Ha ekpochapuwo ndum n'olùlù, we tuam nkume.

54. Miri rubigaram n'isi; asirim, Ebipuwom.

55. Esirim n'olùlù dichasi ala kpọkue aha-Gi, Jehova.

56. Olum ka I nuru; ezobela nti-Gi n'iku-umem, na ntikum.

57. I biaruru nso n'ubọchi m'kpọkuru Gi: I siri, Atula egwu.

58. Onye-nwe-ayi, I kpezuwo ọnu nke nkpuru-obim; I b͕aputawo ndum.

59. Jehova, I huwo nb͕agọm; Gi kpe ikpem.

60. I huwo ibọ̀-ọ́bọ̀ nile ha na èchìchè nile ha n'arum.

61. I nuwo ita-uta-ha, Jehova, na èchìchè nile ha megidem;

62. Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi nēbili imegidem, na ntughari-obi-ha megidem ogologo ubọchi nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù-Ákwá 3