isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù-Ákwá 3 Bible Nso (IGBOB)

1. Mu onwem bu nwoke ahu nke huworo nweda-n'ala site na nkpa-n'aka nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya.

2. Mu ka O duworo me ka m'jegharia n'ọchichiri ghara inwe ìhè.

3. N'ezie, mu ka Ọ nātughari aka-Ya megide ọtutu mb͕e ogologo ubọchi nile.

4. O mewo ka anu-arum na akpukpọ-arum ka nká; Ọ b͕ajiwo ọkpukpum nile.

5. O wuwo ńsí na ike-ọgwugwu dika ulo imegidem, were ya b͕am buruburu.

6. N'ebe nile b͕ara ọchichiri ka O meworo ka m'biri, dika ndi nwuru anwu site na mb͕e ebighi-ebi.

7. Ọ b͕achiwom ogige, m'we ghara ipu apu; O mewo ka ọla eji kem ab͕u di arọ́.

8. Ọzọ, mb͕e m tikuru Chineke nkpu, O mechibido ekperem uzọ.

9. O werewo nkume awara awa b͕achie uzọm nile, okporo-uzọm nile ka O meworo ka ha b͕agọ ab͕agọ.

10. Bear nke nēche anwu ka Ọ burum, ma-ọbu ọdum nke nọ n'ebe-nzuzo di iche iche.

11. Uzọm nile ka O wezugaworo, O we dọbisiem; O mewom ka m'tọb͕ọrọ n'efu.

12. Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, O guzom dika ihe edotara ib͕a àkú.

13. O mewo ka àkú nile nke àkpà-àkú-Ya ba n'akurum abua.

14. Aghọworom ndim nile ihe-ọchi, na abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara ogologo ubọchi nile.

15. O mewo ka ihe nile nke nēlu ilu jum afọ, O mewo ka m'ṅujue wormwood afọ.

16. O were umu nkume kujie ezém nile, Ọ turawom na ntu.

17. I juwo nkpuru-obim ka ọ ghara inọ n'udo; echezọwom ọdi-nma.

18. M'we si, Ikem alawo n'iyì, ya na ncherem nke sitere na Jehova.

19. Cheta nweda-n'alam na nwagharim, na wormwood na ńsí.

20. Nkpuru-obim nēcheta ha nke-ọma, we ruda n'ala nimem.

21. Nka ka m'nēweghachi n'obim, n'ihi nka ka m'nēchere.

22. O sitere n'ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n'ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi.

23. Ha di ọhu kwa-ututu; ihe riri nne ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi bu.

24. Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n'ihi nka ka m'gēchere Ya.

25. Jehova di nma n'ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n'ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ.

26. Ọ di nma ka madu chere nzọputa Jehova, dere kwa du n'ichere ya.

27. Ọ diri nwoke nma ka ọ nēbu yoke na mb͕e ọ di na nwata.

28. Ya nọdu náni ya iche, debe ọnu-ya du, n'ihi na Ọ tukwasiwo ya n'olu-ya.

29. Ya tiye ọnu-ya n'ájá; ma eleghi anya ọ di olile-anya gādi.

30. Ya mere ǹtì-ya nye onye nēti ya ihe; ka ita-uta ju ya afọ.

31. N'ihi na Onye-nwe-ayi agaghi-aju rue mb͕e ebighi-ebi.

32. N'ihi na ọ buru na O mekpa aru, ma Ọ gēnwe obi-ebere dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di.

33. N'ihi na Ọ dighi-esite n'obi-Ya weda umu madu n'ala, mekpa ha aru.

34. Izọpia ndi-nkpọrọ nile nke uwa n'okpuru ukwu,

35. Iwezuga ikpé ọ bula n'iru Onye kachasi ihe nile elu,

36. Ime ka madu b͕agọ ab͕agọ n'okwu-ikpé-ya: Onye-nwe-ayi eleghi ihe ndia anya ọma.

37. Ònye bu onye ahu nke kwuworo okwu, o we rè, mgbe onyenwe-ayi enyeghi iwu?

38. Ọ̀ bughi n'ọnu Onye kachasi ihe nile ka ihe ọjọ na ezi ihe si aputa?

39. Gini mere madu nke di ndu ji atamu ntamu, onye ọ bula, bayere ahuhu nmehie-ya nile?

40. Ka ayi gwuputa ala uzọ nile ayi, nyochaputa ha, laghachikuru Jehova.

41. Ka ayi weliere Chineke Nke bi n'elu-igwe obi-ayi n'ọbu-aka-ayi abua.

42. Ayi onwe-ayi ejehiewo nupu kwa isi; Gi onwe-gi ab͕agharaghi.

43. I werewo iwe kpuchie Onwe-gi, we chua ayi; I b͕uwo, I nweghi ọmiko.

44. I werewo igwe-oji kpuchie Onwe-gi, ka ekpere-ayi we ghara igabiga.

45. Ihe azachapuru azachapu na ihe ajuru aju ka I nēme ayi n'etiti ndi nile di iche iche.

46. Ndi-iro-ayi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide ayi.

47. Oké egwu na olùlù eruwo ayi aru, itọb͕ọ-n'efu na ntipia.

48. Ọtutu iyi nke juputara na miri ka anyam nērùda, n'ihi ntipia nke ada ndim.

49. Anyam nāwusi dika miri, ọ dighi-eguzo kwa du, ghara ikwusi akwusi,

50. Rue mb͕e Jehova gēsi n'elu-igwe lepu anya, hu.

51. Anyam nēme nkpuru-obim ihe, n'ihi umu-ndinyom nile nke obodom.

52. Ndi bu ndi-irom n'efu achusiwo ntám ike dika nnunu.

53. Ha ekpochapuwo ndum n'olùlù, we tuam nkume.

54. Miri rubigaram n'isi; asirim, Ebipuwom.

55. Esirim n'olùlù dichasi ala kpọkue aha-Gi, Jehova.

56. Olum ka I nuru; ezobela nti-Gi n'iku-umem, na ntikum.

57. I biaruru nso n'ubọchi m'kpọkuru Gi: I siri, Atula egwu.

58. Onye-nwe-ayi, I kpezuwo ọnu nke nkpuru-obim; I b͕aputawo ndum.

59. Jehova, I huwo nb͕agọm; Gi kpe ikpem.

60. I huwo ibọ̀-ọ́bọ̀ nile ha na èchìchè nile ha n'arum.

61. I nuwo ita-uta-ha, Jehova, na èchìchè nile ha megidem;

62. Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi nēbili imegidem, na ntughari-obi-ha megidem ogologo ubọchi nile.

63. Legide inọdu-ala-ha, na nbili-ọtọ-ha; mu onwem bu abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara.

64. I gēnyeghachi ha nmeso-ha, Jehova, dika ọlu aka-ha si di.

65. I gēnye ha ihe-nkpudo obi, bú ọb͕ub͕a-iyi I b͕ara ha.