16. O were umu nkume kujie ezém nile, Ọ turawom na ntu.
17. I juwo nkpuru-obim ka ọ ghara inọ n'udo; echezọwom ọdi-nma.
18. M'we si, Ikem alawo n'iyì, ya na ncherem nke sitere na Jehova.
19. Cheta nweda-n'alam na nwagharim, na wormwood na ńsí.
20. Nkpuru-obim nēcheta ha nke-ọma, we ruda n'ala nimem.
21. Nka ka m'nēweghachi n'obim, n'ihi nka ka m'nēchere.
22. O sitere n'ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n'ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi.
23. Ha di ọhu kwa-ututu; ihe riri nne ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi bu.
24. Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n'ihi nka ka m'gēchere Ya.
25. Jehova di nma n'ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n'ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ.
26. Ọ di nma ka madu chere nzọputa Jehova, dere kwa du n'ichere ya.
27. Ọ diri nwoke nma ka ọ nēbu yoke na mb͕e ọ di na nwata.