Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù-Ákwá 2:7-11 Bible Nso (IGBOB)

7. Onye-nwe-ayi ajusiwo ebe-ichu-àjà-Ya, Ọ sọwo ebe nsọ Ya oyi,O mechibidowo mb͕idi nile nke ulo-elu-ya nile nye n'aka onye-iro:Ha emewo ka olu-ha da udà n'ulo Jehova, dika n'ubọchi nke mb͕e akara àkà.

8. Jehova echèwo ibibi mb͕idi ada Zaion;O setiwo eriri, O sepughi aka-Ya n'olulo:O we me ka ékpè na mb͕idi rue újú; n'otù ka ha talatakọworo.

9. Ọnu-uzọ-ama-ya nile emikpuwo n'ala; O mewo ka ihe-ntuchi-ya nile la n'iyì, Ọ b͕ajiwo kwa ha:Eze-ya na ndi-isi-ya nọ n'etiti mba nile ebe iwu nādighi;Ọzọ, ndi-amuma-ya achọtaghi ọhù nke sitere na Jehova.

10. Ndi-okenye nke ada Zaion nānọdu ala, dere du;Ha ekpokwasiwo ájá n'isi-ha; ha ekewo ákwà-nkpe n'úkwù-ha:Umu-ab͕oghọ Jerusalem ndi nāmaghi nwoke erulatawo isi-ha n'ala.

11. Anyam abua adalawo n'isi site n'anya-miri, ngiri-afọm anuwom ọku,Awusiwo umejum n'ala dika miri, n'ihi ntipia nke ada ndim;N'ihi na umu-ntakiri na umu nke nāṅu ara nāda #mbà n'amá nile nke obodo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù-Ákwá 2