Onye-nwe-ayi elowo ebe-obibi nile nke Jekob, ghara inwe ọmiko n'aru ha;Ọ kwadawo ebe nile ewusiri ike nke ada Juda nime nrubiga-ókè nke iwe-Ya:O tidaruwo ha ala:O mewo ala-eze na ndi-isi-ya ka ha ghara idi nsọ.