Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 8:6-11 Bible Nso (IGBOB)

6. Devid we tiye ebe-nguzo-ndi-agha nime Siria Damaskọs: Siria we ghọrọ Devid ndi-orú, nēbute onyinye-inata-iru-ọma. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere.

7. Devid we chiri ọta ọla-edo nke dikwasiri ndi-orù Hedadeza, chita ha na Jerusalem.

8. Eze, bú Devid, we si na Beta, si kwa na Birotai, bú obodo Hedadeza, chiri ọtutu ọla nke-uku.

9. Toi, bú eze Hemat, we nu na Devid etib͕uwo usu-ndi-agha nile nke Hedadeza,

10. Toi we zíe Joram nwa-ya jekuru eze, bú Devid, iju ya ajuju bayere udo-ya, na igọzi ya, n'ihi na o busoworo Hedadeza agha, we tib͕ue ya: n'ihi na nwoke nke nēbuso Toi agha nke-uku ka Hadadeza bu. Ihe ọla-ọcha na ihe ọla-edo na ihe ọla di kwa n'aka Joram inye ya:

11. ihe ndia ka eze, bú Devid, do-kwa-ra nsọ nye Jehova, tiyere ọla-ọcha na ọla-edo nke o doro nsọ site na mba nile nke o budara;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 8