Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 4:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Ish-boshet nwa Sọl we nu na Abnea anwuwo nime Hebron, aka-ya we kuda, Israel nile ma-kwa-ra jijiji.

2. Ma Ish-boshet nwa Sọl nwere ndikom abua ndi bu ndi-isi usu ndi nāpunara madu ihe: aha otù bu Beana, aha nke-ọzọ bú Rikab, ha bu umu Rimon onye Beirot, sitere n'umu Benjamin: (n'ihi na anāgu-kwa-ra Benjamin, Beirot:

3. ndi Beirot we b͕alaga na Gitaim, buru ndi-ọbìa n'ebe ahu rue ta.)

4. Ma Jonatan nwa Sọl nwere nwa-nwoke nke dara ngwurọ n'ukwu-ya abua. Ọ b͕ara arọ ise mb͕e akukọ Sọl na Jonatan siri na Jezreel bia, nwayi nāzù ya we kuru ya, b͕alaga: o rue, mb͕e ọ nēme ngwa ib͕alaga, na nwata ahu dara ada, we ghọ onye-ngwurọ. Aha-ya bu Mefiboshet.

5. Umu Rimon onye Beirot, bú Rikab na Beana, we je, biarue ulo Ish-boshet dika n'ikpo-ọku nke ehihie, ma ya onwe-ya nēdina ndina etiti-ehihie.

6. Ma n'ebe ahu ka ha biara rue etiti ulo, dika ha nēwere ọka wheat; ha we tie ya n'okpuru ọgiriga nke-ise: Rikab na Beana, bú nwa-nne-ya, we wepuga onwe-ha.

7. Ma mb͕e ha batara n'ulo, ka ya onwe-ya nēdina n'ihe-ndina-ya n'ime-ulo-ndina-ya, ha we tib͕ue ya, me ka ọ nwua, wezuga isi-ya, were isi-ya, je ije n'uzọ Araba abali ahu nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 4