Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 24:6-12 Bible Nso (IGBOB)

6. ha we biarue Gilead, ru kwa ala Tahtim-họdshi; ha we biarue Dan-jaan, je buruburu rue Zaidon,

7. biarue ebe ewusiri ike nke Taia, na obodo nile nke ndi-Haivait na ndi Kenean, purue Negeb Juda, nime Bia-sheba.

8. Ha we jegharia n'ala nile, biarue Jerusalem n'ọgwugwu ọnwa iteghete na orú ubọchi.

9. Joab we nye eze ọnu-ọgugu nke ngukọta ọ gukọtara ndi Israel: ma orú nnù ndikom ọgu uzọ ise di n'Israel, ndi bu dìnkpà ndi nāmiputa mma-agha; ndikom Juda di kwa orú nnù ndikom ọgu uzọ atọ na uzọ abua na nnù iri.

10. Obi Devid we ta ya uta mb͕e ọ gusiri ndi Israel. Devid we si Jehova, Emehiewom nke-uku n'ihe m'meworo: ma ub͕u a, Jehova, biko me ka ajọ omume-orú-Gi gabiga; n'ihi na emewom ihe-nzuzu nke-uku.

11. Devid we bilie n'ututu, okwu Jehova we rue Gad nti, bú onye-amuma, onye-ọhu-uzọ nke Devid, si,

12. Je gwa Devid okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ihe atọ ka Mu onwem nēbokwasi gi; rọputara onwe-gi otù nime ha, ka M'we me gi ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 24