Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 24:21-25 Bible Nso (IGBOB)

21. Arọna we si, Gini mere onye-nwem, bú eze, biakuteworo orù-ya? Devid we si, Izuru ebe-nzọcha-ọka-gi n'aka-gi, iwuru Jehova ebe-ichu-àjà, ka ewe b͕ochie ihe otiti a n'ebe ndi Israel nọ.

22. Arọna we si Devid, Ka onye-nwem, bú eze were ihe di nma n'anya-ya sure ọku, le, ehi iji chu àjà-nsure-ọku, na ihe nzọcha-ọka nile na ihe ehi nile ka ha buru nkú:

23. ihe a nile onye-nwem eze ka Arọna, nyere eze. Arọna we si eze, Ka ihe-gi tọ Jehova, bú Chineke-gi, utọ

24. Eze we si Arọna, É-è; kama aghaghm izuru ya n'aka-gi n'ọnu-ahia: m'gaghi-esure-kwa-ra Jehova, bú Chinekem, àjà-nsure-ọku nke m'nētiyeghi ego ọ bula. Devid we were ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri zuru ebe-nzọcha-ọka ahu na ehi ahu.

25. Devid we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo. Ewe riọta Jehova aririo bayere ala ahu, ewe b͕ochie ihe-otiti ahu n'ebe Israel nọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 24