Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 23:3-13 Bible Nso (IGBOB)

3. Chineke Israel siri,Mu ka Oké Nkume Israel gwara okwu:Onye nāchi madu bu onye ezi omume,Ọ nāchi n'egwu Chineke

4. Ọ di kwa ka ìhè ututu, mb͕e anyanwu nāwa,Bú ututu igwe-oji nādighi;Mb͕e ahihia ndu nēpuputa n'ala,Site n'ọmumu-anyanwu, site na miri-ozuzo.

5. N'ihi na ọ bughi otú a ka ulom di n'ebe Chineke nọ;N'ihi na ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka Ọ b͕aworo nyem,Bú ọb͕ub͕a-ndu edoworo n'usoro n'ihe nile, nke edebewo-kwa-ra:N'ihi na nzọputam nile, na ihe-utọ nile,N'ezie Ọ gaghi-eme ka o pute.

6. Ma ndi jọb͕uru onwe-ha di ka ogwu anēkopu ekopu, ha nile,N'ihi na ọ bughi aka ka eji ewere ha:

7. Ma nwoke nke nēmetu ha akaGēnweju ígwè na osisi ube aka:Agēwere kwa ọku suresia ha n'ọnọdu-ha.

8. Ndia bu aha ndi-dike, ndi Devid nwere; Josheb-bashebet onye-Tahkemonait, onye-isi nke ndi-ọchi-agha; onye ahu bu Adino onye-Eznait: onye nēmegide nnù ndikom abua eb͕uru n'otù ub͕ò.

9. Nke so ya bu Eleeza nwa Dodai nwa onye Ahoa, bú otù onye n'etiti ndi-dike atọ ahu ndi ha na Devid nọ mb͕e ha rara onwe-ha nye rue ọnwu n'etiti ndi Filistia ndi chikọtara onwe-ha n'ebe ahu ibu agha, ma ndikom Israel rigoro:

10. onye ahu biliri, tib͕u ndi Filistia rue mb͕e ike gwuru aka-ya, aka-ya we rapara na mma-agha: Jehova we zọputa nzọputa uku n'ubọchi ahu; ndi Israel we laghachi soro ya n'azu nání iyipu ihe di n'aru ndi eb͕uru eb͕u.

11. Nke so ya bu Shama nwa Agi onye-Hararait. Ndi Filistia we chikọta onwe-ha n'usu, ma òkè ubi di n'ebe ahu juputara na lentil; ma ndi Israel b͕apuru n'iru ndi Filistia.

12. O we guzo onwe-ya n'etiti òkè ahu, naputa ya, tib͕ue ndi Filistia: Jehova we zọputa nzọputa uku.

13. Ndikom atọ n'etiti orú ndi-isi na iri ahu we rida, biakute Devid n'owuwe-ihe-ubi rue ọb͕à Adulam; ma usu ndi Filistia amawo ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Refaim.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 23