isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 23 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndi a bu okwu ikpe-azu nke Devid.Ihe nke si n'ọnu Devid nwa Jesi puta,Na ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, bú onye emere ka o bilie,Bayere onye nke Chineke Jekob etere manu,Na onye nwere olu di utọ n'ibù abù ọma Israel:

2. Mọ nke Jehova kwuru site n'ọnum,Okwu-Ya di kwa n'irem.

3. Chineke Israel siri,Mu ka Oké Nkume Israel gwara okwu:Onye nāchi madu bu onye ezi omume,Ọ nāchi n'egwu Chineke

4. Ọ di kwa ka ìhè ututu, mb͕e anyanwu nāwa,Bú ututu igwe-oji nādighi;Mb͕e ahihia ndu nēpuputa n'ala,Site n'ọmumu-anyanwu, site na miri-ozuzo.

5. N'ihi na ọ bughi otú a ka ulom di n'ebe Chineke nọ;N'ihi na ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka Ọ b͕aworo nyem,Bú ọb͕ub͕a-ndu edoworo n'usoro n'ihe nile, nke edebewo-kwa-ra:N'ihi na nzọputam nile, na ihe-utọ nile,N'ezie Ọ gaghi-eme ka o pute.

6. Ma ndi jọb͕uru onwe-ha di ka ogwu anēkopu ekopu, ha nile,N'ihi na ọ bughi aka ka eji ewere ha:

7. Ma nwoke nke nēmetu ha akaGēnweju ígwè na osisi ube aka:Agēwere kwa ọku suresia ha n'ọnọdu-ha.

8. Ndia bu aha ndi-dike, ndi Devid nwere; Josheb-bashebet onye-Tahkemonait, onye-isi nke ndi-ọchi-agha; onye ahu bu Adino onye-Eznait: onye nēmegide nnù ndikom abua eb͕uru n'otù ub͕ò.

9. Nke so ya bu Eleeza nwa Dodai nwa onye Ahoa, bú otù onye n'etiti ndi-dike atọ ahu ndi ha na Devid nọ mb͕e ha rara onwe-ha nye rue ọnwu n'etiti ndi Filistia ndi chikọtara onwe-ha n'ebe ahu ibu agha, ma ndikom Israel rigoro:

10. onye ahu biliri, tib͕u ndi Filistia rue mb͕e ike gwuru aka-ya, aka-ya we rapara na mma-agha: Jehova we zọputa nzọputa uku n'ubọchi ahu; ndi Israel we laghachi soro ya n'azu nání iyipu ihe di n'aru ndi eb͕uru eb͕u.

11. Nke so ya bu Shama nwa Agi onye-Hararait. Ndi Filistia we chikọta onwe-ha n'usu, ma òkè ubi di n'ebe ahu juputara na lentil; ma ndi Israel b͕apuru n'iru ndi Filistia.

12. O we guzo onwe-ya n'etiti òkè ahu, naputa ya, tib͕ue ndi Filistia: Jehova we zọputa nzọputa uku.

13. Ndikom atọ n'etiti orú ndi-isi na iri ahu we rida, biakute Devid n'owuwe-ihe-ubi rue ọb͕à Adulam; ma usu ndi Filistia amawo ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Refaim.

14. Ma Devid nọ n'ebe ahu ewusiri ike mb͕e ahu, ma ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di na Bet-lehem mb͕e ahu.

15. Devid we chọsie ike, si, Ònye gēme ka m'ṅua miri sitere n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama:

16. Ndi-dike atọ ahu we wapue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia, sere miri n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama, ha we būru ya, kutere Devid: ma o kweghi iṅu ya, o we wusiere ya Jehova.

17. Ọ si, Ya burum ihe-árú, Jehova, ime ihe a: #m'gāṅu ọbara ndikom ahu ndi ji ndu-ha n'aka-ha nēje? o kweghi kwa iṅu ya. Ihe ndia ka ndi-dike atọ ahu mere.

18. Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, nwa Zeruaia, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu. Onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n'etiti ndikom atọ ahu.

19. Àdighi-asọpuru ya kari ndikom atọ ahu? o we ghọrọ ha onye-isi: ma o rughi ndikom atọ mbu ahu.

20. Benaia kwa, nwa Jehoiada, nwa nke nwoke bu dìnkpà nke Kabzeel, onye di uku n'ime ihe, onye ahu tib͕uru umu-ndikom abua nke Ariel nke Moab: onye ahu rida-kwa-ra tib͕ue ọdum n'etiti olùlù n'ubọchi snow nēzò.

21. Onye ahu tib͕u-kwa-ra nwoke ahu, bú onye Ijipt, bú nwoke mara nma ile anya: ube di kwa n'aka onye Ijipt ahu; ma o ji nkpa-n'aka ridakuru ya, napu ube ahu n'aka onye Ijipt n'ike, were ube-ya b͕ue ya.

22. Ihe ndia ka Benaia nwa Jehoiada mere, we nwe aha n'etiti ndi-dike atọ ahu.

23. Anāsọpuru ya kari orú ndikom na iri ahu, ma o rughi ndikom atọ mbu ahu. Devid we do ya ibà n'etiti ndi nānu okwu-ya.

24. Asahel nwa-nne Joab bu otù onye n'etiti orú ndikom na iri ahu; Elhanan nwa Dodo nke Bet-lehem;

25. Shama onye Harod, Elika onye Harod;

26. Hilez onye-Paltait, Ira nwa Ikesh onye Tekoa;

27. Abieza onye Anatot, Mebunai onye Husha;

28. Zalmon onye Ahoa, Maharai onye Netofa;

29. Hileb nwa Beana onye Netofa, Itai nwa Ribai nke Gibea umu Benjamin;

30. Benaia onye Piraton, Hidai nke miri-iyi Gaash;

31. Abi-albon onye Araba, Azmavet onye Bahurim;

32. Eliahba onye Shaalabin, nke umu Jashen, Jonatan;

33. Shama onye-Hararait, Ahiam nwa Shara onye-Ararait;

34. Elifelet nwa Ahasbai, nwa onye Meakat, Eliam nwa Ahitofel onye Gailo;

35. Hezro onye Kamel, Paarai onye Arab;

36. Igal nwa Netan nke Zoba, Bani onye Gad;

37. Zelek onye Amon, Naharai onye Beirot, onye nēbu ihe-agha Joab nwa Zeruaia;

38. Ira onye Jeta, Gareb onye Jeta;

39. Uraia onye Het: ha nile di orú ndikom na iri na asa.