Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 23:17-26 Bible Nso (IGBOB)

17. Ọ si, Ya burum ihe-árú, Jehova, ime ihe a: #m'gāṅu ọbara ndikom ahu ndi ji ndu-ha n'aka-ha nēje? o kweghi kwa iṅu ya. Ihe ndia ka ndi-dike atọ ahu mere.

18. Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, nwa Zeruaia, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu. Onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n'etiti ndikom atọ ahu.

19. Àdighi-asọpuru ya kari ndikom atọ ahu? o we ghọrọ ha onye-isi: ma o rughi ndikom atọ mbu ahu.

20. Benaia kwa, nwa Jehoiada, nwa nke nwoke bu dìnkpà nke Kabzeel, onye di uku n'ime ihe, onye ahu tib͕uru umu-ndikom abua nke Ariel nke Moab: onye ahu rida-kwa-ra tib͕ue ọdum n'etiti olùlù n'ubọchi snow nēzò.

21. Onye ahu tib͕u-kwa-ra nwoke ahu, bú onye Ijipt, bú nwoke mara nma ile anya: ube di kwa n'aka onye Ijipt ahu; ma o ji nkpa-n'aka ridakuru ya, napu ube ahu n'aka onye Ijipt n'ike, were ube-ya b͕ue ya.

22. Ihe ndia ka Benaia nwa Jehoiada mere, we nwe aha n'etiti ndi-dike atọ ahu.

23. Anāsọpuru ya kari orú ndikom na iri ahu, ma o rughi ndikom atọ mbu ahu. Devid we do ya ibà n'etiti ndi nānu okwu-ya.

24. Asahel nwa-nne Joab bu otù onye n'etiti orú ndikom na iri ahu; Elhanan nwa Dodo nke Bet-lehem;

25. Shama onye Harod, Elika onye Harod;

26. Hilez onye-Paltait, Ira nwa Ikesh onye Tekoa;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 23