Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 22:33-43 Bible Nso (IGBOB)

33. Chineke bu ebem siri ike nke di ike nke-uku:Ọ nākwazu kwa uzọm.

34. O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele:N'elu ebem di elu ka Ọ nēguzokwam.

35. O nēzí akam abua ibu agha;Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla.

36. I nyewokwam ọta nzọputa-Gi:Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba.

37. I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum,Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.

38. Ka m'chua ndi-irom, we kpochapu ha;Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia.

39. M'we me ka ha gwusia, anamamapú kwa ha, ha agaghi-ebili kwa:Ha we da n'okpuru ukwum abua.

40. I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha:I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum.

41. Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha,Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.

42. Ha nāgha anya, ma ọ dighi onye nāzọputa ha;N'ebe Jehova nọ ka ha nāgha anya, ma Ọ zaghi ha.

43. Anamesu kwa ha me ka ha di ka ájá ala,Anamegwe ha me ka ha di ka apiti èzí, anametisa ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 22