Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 19:6-21 Bible Nso (IGBOB)

6. n'ihu ndi nākpọ gi asi n'anya, na n'ikpọ ndi nāhu gi n'anya asi. N'ihi na i gosiwo ta, na ndi-isi na ndi-orù abughi ihe n'anya-gi: n'ihi na amawom, ta, na asi na Absalom adiwo ndu, asi kwa na ayi nile anwuwo ta, mb͕e ahu o gēzi ezi n'anya-gi.

7. Ma ub͕u a bilie, pua, gwa ndi-orù-gi okwu gāba ha n'obi: n'ihi na aṅuwom iyi na Jehova, na ọ dighi otù nwoke gēsoro gi nọ ọnọdu abali a, ma asi na i gaghi-apu: ma nke ahu gājọrọ gi njọ kari ihe ọjọ nile nke biakwasiworo gi site ka i di na nwata rue ub͕u a.

8. Eze we bilie, nọdu n'ọnu-uzọ-ama. Ha we gosi ndi ya nile, si, Le, eze nānọdu n'ọnu-uzọ-ama: ndi ahu nile we bia n'iru eze.Ma Israel b͕alagara, nwoke o bula n'ulo-ikwū-ya.

9. Ndi Israel nile we nēse okwu n'ebo nile nke Israel, si, Eze naputara ayi n'ọbu-aka ndi-iro-ayi, ya onwe-ya me kwa-ra ka ayi wepuga onwe-ayi n'ọbu-aka ndi Filistia; ma ub͕u a o siwo n'ala b͕alaga n'ihi Absalom.

10. Ma Absalom, onye ayi tere manu ibu isi-ayi, anwuwo n'agha. Ma ub͕u a n'ihi gini ka unu onwe-unu nādighi-ekwu ime ka eze lata?

11. Eze, bú Devid, we zigara Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, ozi, si, Gwanu ndi-okenye Juda okwu, si, N'ìhi gini ka unu bu ndi-ikpe-azu ime ka eze lata n'ulo-ya? ma okwu Israel nile abiaruwo eze nti, ime ka ọ lata n'ulo-ya?

12. Umu-nnem ka unu bu, ọkpukpum na anu-arum ka unu bu: n'ìhi gini kwa ka unu bu ndi-ikpe-azu ime ka eze lata?

13. Amasa ka unu gāsi kwa, Ọ̀ bughi ọkpukpum na anu-arum ka i bu? Chineke mem otú a, mekwam ihe ọzọ otú a, ma ọ buru na i ghọghi onye-isi usu-ndi-agha n'irum ubọchi nile n'ọnọdu Joab.

14. O we me ka obi ndikom nile nke Juda rulata, dika otù nwoke; ha we zigara eze ozi, si, Lata, gi onwe-gi na ndi-orù-gi nile.

15. Eze we lata, bia rue Jọdan. Juda we biarue Gilgal, ije izute eze, ime ka eze gabiga Jọdan.

16. Shimai nwa Gira, bú onye Benjamin, nke sitere na Bahurim, we me ngwa soro ndikom Juda ridata izute eze, bú Devid.

17. Nnù ndikom abua na ọgu iri so-kwa-ra ya site na Benjamin; Ziba kwa, onye nējere ulo Sọl ozi, ya na umu-ya ndikom iri na ise na orú ndi-orú-ya; ha we jisie ike gabiga Jọdan n'iru eze.

18. Ma ub͕o-nwebiga gabigara iwebiga ndi ulo eze, na ime ihe di nma n'anya-ya. Shimai nwa Gira we da n'iru eze, mb͕e ọ gabigara Jọdan.

19. Ọ si eze, Ka onye-nwem ghara igu ajọ omume nyem, echeta-kwa-la ihe orù-gi mere n'ajọ omume n'ubọchi onye-nwem, bú eze, siri na Jerusalem pua, ka eze we tiye ya n'obi-ya.

20. N'ihi na orù-gi amawo na mu onwem emehiewo: ma, le, abiawom ta, buru ulo nile nke Josef uzọ irida izute onye-nwem, bú eze.

21. Abishai nwa Zeruaia we za, si, Àgaghi-eme ka Shimai nwua n'ihi nka, n'ihi na ọ kọchara onye Jehova etere manu?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 19