Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 19:4-16 Bible Nso (IGBOB)

4. Ma eze kpuchiri iru-ya, eze we tie nkpu n'oké olu, si, Nwam Absalom, Absalom, nwam, nwam!

5. Joab we bakuru eze n'ulo, si, I mewo ka ihere me iru ndi-orú-gi nile ta, bú ndi nēwepuga ndu-gi, na ndu umu-gi ndikom na nke umu-gi ndinyom, na ndu ndinyom-i, na ndu ndi-iko-gi nwayi, ta;

6. n'ihu ndi nākpọ gi asi n'anya, na n'ikpọ ndi nāhu gi n'anya asi. N'ihi na i gosiwo ta, na ndi-isi na ndi-orù abughi ihe n'anya-gi: n'ihi na amawom, ta, na asi na Absalom adiwo ndu, asi kwa na ayi nile anwuwo ta, mb͕e ahu o gēzi ezi n'anya-gi.

7. Ma ub͕u a bilie, pua, gwa ndi-orù-gi okwu gāba ha n'obi: n'ihi na aṅuwom iyi na Jehova, na ọ dighi otù nwoke gēsoro gi nọ ọnọdu abali a, ma asi na i gaghi-apu: ma nke ahu gājọrọ gi njọ kari ihe ọjọ nile nke biakwasiworo gi site ka i di na nwata rue ub͕u a.

8. Eze we bilie, nọdu n'ọnu-uzọ-ama. Ha we gosi ndi ya nile, si, Le, eze nānọdu n'ọnu-uzọ-ama: ndi ahu nile we bia n'iru eze.Ma Israel b͕alagara, nwoke o bula n'ulo-ikwū-ya.

9. Ndi Israel nile we nēse okwu n'ebo nile nke Israel, si, Eze naputara ayi n'ọbu-aka ndi-iro-ayi, ya onwe-ya me kwa-ra ka ayi wepuga onwe-ayi n'ọbu-aka ndi Filistia; ma ub͕u a o siwo n'ala b͕alaga n'ihi Absalom.

10. Ma Absalom, onye ayi tere manu ibu isi-ayi, anwuwo n'agha. Ma ub͕u a n'ihi gini ka unu onwe-unu nādighi-ekwu ime ka eze lata?

11. Eze, bú Devid, we zigara Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, ozi, si, Gwanu ndi-okenye Juda okwu, si, N'ìhi gini ka unu bu ndi-ikpe-azu ime ka eze lata n'ulo-ya? ma okwu Israel nile abiaruwo eze nti, ime ka ọ lata n'ulo-ya?

12. Umu-nnem ka unu bu, ọkpukpum na anu-arum ka unu bu: n'ìhi gini kwa ka unu bu ndi-ikpe-azu ime ka eze lata?

13. Amasa ka unu gāsi kwa, Ọ̀ bughi ọkpukpum na anu-arum ka i bu? Chineke mem otú a, mekwam ihe ọzọ otú a, ma ọ buru na i ghọghi onye-isi usu-ndi-agha n'irum ubọchi nile n'ọnọdu Joab.

14. O we me ka obi ndikom nile nke Juda rulata, dika otù nwoke; ha we zigara eze ozi, si, Lata, gi onwe-gi na ndi-orù-gi nile.

15. Eze we lata, bia rue Jọdan. Juda we biarue Gilgal, ije izute eze, ime ka eze gabiga Jọdan.

16. Shimai nwa Gira, bú onye Benjamin, nke sitere na Bahurim, we me ngwa soro ndikom Juda ridata izute eze, bú Devid.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 19