Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 19:2-6 Bible Nso (IGBOB)

2. Nzọputa we ghọrọ ndi Devid nile iru-újú n'ubọchi ahu: n'ihi na ndi Devid nuru n'ubọchi ahu, si, Ọ nēwuta eze n'ihi nwa-ya.

3. Ndi Devid we ghèré bà n'obodo n'ubọchi ahu, dika ndi ihere nēme nēghepu mb͕e ha nāb͕alaga n'agha.

4. Ma eze kpuchiri iru-ya, eze we tie nkpu n'oké olu, si, Nwam Absalom, Absalom, nwam, nwam!

5. Joab we bakuru eze n'ulo, si, I mewo ka ihere me iru ndi-orú-gi nile ta, bú ndi nēwepuga ndu-gi, na ndu umu-gi ndikom na nke umu-gi ndinyom, na ndu ndinyom-i, na ndu ndi-iko-gi nwayi, ta;

6. n'ihu ndi nākpọ gi asi n'anya, na n'ikpọ ndi nāhu gi n'anya asi. N'ihi na i gosiwo ta, na ndi-isi na ndi-orù abughi ihe n'anya-gi: n'ihi na amawom, ta, na asi na Absalom adiwo ndu, asi kwa na ayi nile anwuwo ta, mb͕e ahu o gēzi ezi n'anya-gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 19