Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 18:27-33 Bible Nso (IGBOB)

27. Onye-nche we si, Mu onwem nāhu ọb͕ub͕a-ọsọ nke onye mbu, ọ di ka ọb͕ub͕a-ọsọ Ahimaaz nwa Zedok. Eze we si, Ezi nwoke ka onye ahu bu, ọ bu kwa ezi ozi ọma ka ọ nābia izì.

28. Ahimaaz we kpọ òkù, si eze, Udo. Ọ kpọ isi ala nye eze, kpuchie iru-ya n'ala, si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke-gi, bu, Onye mechibidoworo ndikom ahu ndi weliri aka-ha imegide onye-nwem, bú eze.

29. Eze we si, Ùdo diri nwa-okorọbia ahu, bú Absalom: Ahimaaz we si, Ahurum oké ìgwè madu mb͕e Joab zitere orú eze na orù-gi, ma amaghm ihe ọ bu.

30. Eze we si, Chigharia, guzo onwe-gi n'ebe a. O we chigharia, guzo.

31. Ma, le, onye Kush biara; onye Kush we si, Ka ezìe onye-nwem, bú eze, ozi ọma: n'ihi na Jehova ekpeputawo gi ta n'aka ndi nile nēbili imegide gi.

32. Eze we si onye Kush ahu, Ùdo diri nwa-okorọbia ahu, bú Absalom? Onye Kush we si, Ndi-iro onye-nwem, bú eze, na ndi nile ndi biliworo megide gi imejọ gi, ka ha di ka nwa-okorọbia ahu.

33. Eze we ma jijiji nke-uku, rigo rue ulo-elu nke ọnu-uzọ-ama, kwa ákwá: ma otú a ka o siri mb͕e ọ nēje, Nwam Absalom, nwam, nwam Absalom! ọ gādim nọ̄ nma ma asi na mu onwem anwuwo n'ọnọdu gi, Absalom, nwam, nwam!

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 18