Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 17:23-29 Bible Nso (IGBOB)

23. Ma Ahitofel huru na emeghi ihe ọ duru n'ọdu, o we jikwa inyinya-ibu-ya, bilie, la n'ulo-ya, rue obodo-ya, o we nye ulo-ya iwu, kwub͕u onwe-ya: o we nwua, elíe ya n'ílì nna-ya.

24. Ma Devid biaruru Mahanaim. Absalom we gabiga Jọdan, ya onwe-ya na ndikom nile nke Israel tiyere ya.

25. Ma Amasa ka Absalom doro onye-isi usu-ndi-agha n'ọnọdu Joab. Ma Amasa bu nwa otù nwoke, aha-ya bu Itra onye Israel, onye bakuru Abigal nwa-nwayi Nehash, nwa-nne-nwayi nke Zeruaia nne Joab.

26. Israel na Absalom we ma ulo-ikwū-ha n'ala Gilead.

27. O rue, mb͕e Devid biaruru Mahanaim, na Shobi nwa Nehash nke Raba umu Amon, na Makia nwa Amiel nke Lo-deba, na Bazilai onye Gilead nke Rogelim,

28. wetara nso Devid, weta kwa nso ndi ya na ha nọ, ihe-ndina, na ọkwa, na ite nke ọkpu-ite kpuru, na ọka wheat, na ọka barley, na utu ọka, na ọka aṅara aṅa, na akidi, na lentil, na ọka aṅara n'oko,

29. na manu-aṅu, na miri-ara-ehi nke raru araru, na ìgwè ewu na aturu, na cheese nke ìgwè ehi, ka ha rie: n'ihi na ha siri, Agu nāgu ndi nka, ha nāda kwa mbà, akpiri nākpọ kwa ha nku, n'ọzara.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 17