Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 17:20-29 Bible Nso (IGBOB)

20. Ndi-orù Absalom we biakute nwayi ahu n'ulo, si, Òle ebe Ahimaaz na Jonatan nọ? Nwayi ahu we si ha, Ha agabigawo iyi miri. Ha we chọ, ma ha achọtaghi ha, ha we lata na Jerusalem.

21. O rue, mb͕e ha lasiri, na ha siri n'olùlù-miri ahu rigota, je, gosi eze, bú Devid; ha we si Devid, Bilienu, gabiga miri ngwa ngwa; n'ihi na otú a ka Ahitofel duworo ọdu megide unu.

22. Devid we bilie, ya na ndi nile ndi ya na ha nọ, ha we gabiga Jọdan; mb͕e ìhè ututu putara ọ dighi onye fọduru nke nāgabigaghi Jọdan.

23. Ma Ahitofel huru na emeghi ihe ọ duru n'ọdu, o we jikwa inyinya-ibu-ya, bilie, la n'ulo-ya, rue obodo-ya, o we nye ulo-ya iwu, kwub͕u onwe-ya: o we nwua, elíe ya n'ílì nna-ya.

24. Ma Devid biaruru Mahanaim. Absalom we gabiga Jọdan, ya onwe-ya na ndikom nile nke Israel tiyere ya.

25. Ma Amasa ka Absalom doro onye-isi usu-ndi-agha n'ọnọdu Joab. Ma Amasa bu nwa otù nwoke, aha-ya bu Itra onye Israel, onye bakuru Abigal nwa-nwayi Nehash, nwa-nne-nwayi nke Zeruaia nne Joab.

26. Israel na Absalom we ma ulo-ikwū-ha n'ala Gilead.

27. O rue, mb͕e Devid biaruru Mahanaim, na Shobi nwa Nehash nke Raba umu Amon, na Makia nwa Amiel nke Lo-deba, na Bazilai onye Gilead nke Rogelim,

28. wetara nso Devid, weta kwa nso ndi ya na ha nọ, ihe-ndina, na ọkwa, na ite nke ọkpu-ite kpuru, na ọka wheat, na ọka barley, na utu ọka, na ọka aṅara aṅa, na akidi, na lentil, na ọka aṅara n'oko,

29. na manu-aṅu, na miri-ara-ehi nke raru araru, na ìgwè ewu na aturu, na cheese nke ìgwè ehi, ka ha rie: n'ihi na ha siri, Agu nāgu ndi nka, ha nāda kwa mbà, akpiri nākpọ kwa ha nku, n'ọzara.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 17