Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 17:18-24 Bible Nso (IGBOB)

18. Otù nwa-okoro we hu ha, gosi, Absalom: ha abua we je ngwa ngwa, ba n'ulo otù nwoke nime Bahurim, onye nwere olùlù-miri n'ogige-ya; ha we rida n'ebe ahu.

19. Nwayi nwe-ulo we were ihe-nkpuchi-ya b͕asa ya n'ọnu olùlù-miri ahu, tusa ọka asuru asu n'elu ya; ma ọ dighi ihe amara.

20. Ndi-orù Absalom we biakute nwayi ahu n'ulo, si, Òle ebe Ahimaaz na Jonatan nọ? Nwayi ahu we si ha, Ha agabigawo iyi miri. Ha we chọ, ma ha achọtaghi ha, ha we lata na Jerusalem.

21. O rue, mb͕e ha lasiri, na ha siri n'olùlù-miri ahu rigota, je, gosi eze, bú Devid; ha we si Devid, Bilienu, gabiga miri ngwa ngwa; n'ihi na otú a ka Ahitofel duworo ọdu megide unu.

22. Devid we bilie, ya na ndi nile ndi ya na ha nọ, ha we gabiga Jọdan; mb͕e ìhè ututu putara ọ dighi onye fọduru nke nāgabigaghi Jọdan.

23. Ma Ahitofel huru na emeghi ihe ọ duru n'ọdu, o we jikwa inyinya-ibu-ya, bilie, la n'ulo-ya, rue obodo-ya, o we nye ulo-ya iwu, kwub͕u onwe-ya: o we nwua, elíe ya n'ílì nna-ya.

24. Ma Devid biaruru Mahanaim. Absalom we gabiga Jọdan, ya onwe-ya na ndikom nile nke Israel tiyere ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 17