Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 16:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Devid we gabiga elu nrigo nke-ntà, ma, le, Ziba, onye nējere Mefiboshet ozi, zutere ya, chiri inyinya-ibu abua ejikwara ejikwa, ọgu ob͕e achicha iri di kwa n'elu ha, na ọgu uyọkọ nkpuru-vine amiri ami ise, na ọgu nkpuru mb͕e okpom-ọku ise, na otù karama-akpukpọ manya-vine.

2. Eze we si Ziba, Gina ka i gēji ihe ndia me? Ziba we si, Inyinya-ibu ndia bu ka ndi ulo eze we nọkwasi ha; achicha na nkpuru mb͕e okpom-ọku bu ka umu-okorọbia we rie ha; manya-vine bu ka ndi nāda mbà nọzara we ṅua.

3. Eze we si, Ma òle ebe nwa onye-nwe-gi nọ? Ziba we si eze, Le, ọ nānọ na Jerusalem: n'ihi na ọ siri, Ta ka ulo Israel gēnyeghachim ala-eze nnam.

4. Eze we si Ziba, Le, gi gēnwe ihe nile Mefiboshet nwere. Ziba we si, Anamakpọ isi ala; ka m'huta amara n'iru gi, onye-nwem, bú eze.

5. Eze, bú Devid, we biarute Bahurim, ma, le, otú nwoke nke sitere n'ab͕uru ulo Sọl nēsi n'ebe ahu puta, aha-ya bu Shimai, nwa Gira: ọ nāputa, nākọcha ka ọ nāputa.

6. Ọ tua Devid nkume, tu kwa ndi-orù nile nke eze, bú Devid: ndi Israel nile na ndi-dike nile di kwa n'aka-nri-ya na n'aka-ekpe-ya.

7. Ma otú a ka Shimai siri mb͕e ọ nākọcha, Pua, pua, gi nwoke ọbara na nwoke jọb͕uru onwe-ya:

8. Jehova eweghachiwo n'isi-gi ọbara nile nke ulo Sọl, onye i buworo eze n'ọnọdu ya; Jehova enyewo kwa ala-eze n'aka Absalom, bú nwa-gi: ma, le, n'ihe ọjọ gi ka ejideworo gi, n'ihi na nwoke ọbara ka i bu.

9. Abishai nwa Zeruaia we si eze, N'ìhi gini ka nkita nka nke nwuru anwu nākọcha onye-nwem, bú eze? biko, ka m'gabiga, wezuga isi-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 16