Eze we si Ziba, Gina ka i gēji ihe ndia me? Ziba we si, Inyinya-ibu ndia bu ka ndi ulo eze we nọkwasi ha; achicha na nkpuru mb͕e okpom-ọku bu ka umu-okorọbia we rie ha; manya-vine bu ka ndi nāda mbà nọzara we ṅua.