Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 15:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e nka gasiri, na Absalom doziri onwe-ya ub͕ọ-ala na inyinya, na ọgu ndikom abua na iri ndi nāb͕a ọsọ n'iru ya.

2. Absalom we bilie n'isi-ututu, guzo n'akuku uzọ ọnu-uzọ-ama: o rue, mb͕e nwoke ọ bula nwere okwu nke gēru eze nti ka o we kpe ya, na Absalon kpọro ya, si, Òle obodo gi onwe-gi si bia? Ọ si, Otú nime ebo Israel ka orù-gi si bia.

3. Absalom we si ya, Le, okwu-gi nile di nma, zi kwa ezi; ma ọ dighi onye nēge gi nti site n'ebe eze nọ.

4. Absalom we si, Ònye gēdom onye-ikpe n'ala nka, ka nwoke ọ bula nke nwere okwu ma-ọbu ikpé we biakutem, m'we kpọ ya onye ezi omume!

5. O rue, mb͕e nwoke ọ bula biaruru ya nso ikpọ isi ala nye ya, na o setiri aka-ya, jide ya, sututu ya ọnu.

6. Absalom we mere Israel nile dika okwu a si di, bú ndi biakutere eze ka ekpe ha ikpe: Absalom we zuru obi ndikom Israel n'ori.

7. O rue, n'ọgwugwu ọgu arọ abua, na Absalom siri eze, Biko, ka m'je kwughachi nkwam, nke, m'kwere Jehova, nime Hebron.

8. N'ihi na orù-gi kwere nkwa mb͕e m'biri na Geshua nime Siria, si, Ọ buru na Jehova eme ka m'laghachi na Jerusalem n'ezie, m'gēfè kwa Jehova òfùfè.

9. Eze we si ya, Je n'udo. O we bilie, jerue Hebron.

10. Absalom we ziga ndi-nledo n'ebo nile nke Israel, si, Mb͕e unu nuru olu opì-ike, unu gāsi kwa, Absalom bu eze na Hebron.

11. Ọgu ndikom iri we si na Jerusalem soro Absalom je, bú ndi akpọrọ, ha we nēje n'izu-okè obi-ha; ma ha amaghi ihe ọ bula.

12. Absalom we zipu Ahitofel onye Gailo, bú onye nādu Devid ọdu, n'obodo-ya, bú Gailo mb͕e ọ nāchu àjà. Nkekọta ahu we di ike; ndi Israel nāba kwa uba nēje n'iru n'iru n'aka Absalom.

13. Onye nēgosi ihe we biakute Devid, si, Obi ndikom Israel di iso Absalom n'azu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 15