O rue, mb͕e nka gasiri, na Absalom doziri onwe-ya ub͕ọ-ala na inyinya, na ọgu ndikom abua na iri ndi nāb͕a ọsọ n'iru ya.