Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 14:30-33 Bible Nso (IGBOB)

30. O we si ndi-orù-ya, Lenu, òkè ala-ubi Joab di n'akuku alam, o nwe-kwa-ra ọka barley n'ebe ahu: jenu, sue ya ọku. Ndi-orù Absalom we sue òkè ala-ubi ahu ọku.

31. Joab we bilie, biakute Absalom rue ulo-ya, si ya, N'ìhi gini ka ndi-orù-gi suworo òkè ala-ubim ọku?

32. Absalom we si Joab, Le, eziterem i ozi, si, Bia n'ebe a, ka m'ziga kwa gi jekuru eze, si N'ìhi gini ka m'siworo na Geshua bia? ọ gādim nma ma asi na mu onwem anọdu n'ebe ahu rue ub͕u a: ma ub͕u a ka m'hu iru eze; ọ buru kwa na ajọ omume adi nimem, ya me ka m'nwua.

33. Joab we biakute eze, gosi ya: o we kpọ Absalom, o we biakute eze, kpọ isi ala nye ya, kpuchie iru-ya n'ala n'iru eze: eze we sutu Absalom ọnu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 14