isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 14 Bible Nso (IGBOB)

1. Joab nwa Zeruaia we mara na obi eze di n'ebe Absolom nọ.

2. Joab we ziga ozi na Tekoa, si n'ebe ahu kuta otù nwayi mara ihe, si ya, Biko, me onwe-gi onye nēru újú biko, yiri kwa uwe iru-újú, ete-kwa-la onwe-gi manu, kama di ka nwayi nke nēru újú ọtutu ubọchi ndia n'ihi onye nwuru anwu:

3. i gābakuru kwa eze, gwa ya okwu dika okwu a si di. Joab we tiye okwu n'ọnu-ya.

4. Nwayi Tekoa we gwa eze okwu, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala, si, Zọputam eze.

5. Eze we si ya, Gini nēme gi? Ọ si, n'ezie nwayi di-ya nwuru ka m'bu, dim anwuwo kwa.

6. Nwayi nējere gi ozi nwe-kwa-ra umu-ndikom abua, ha abua we lua ọ̀gù n'ọhia, ọ dighi kwa onye-nnaputa n'etiti ha, ma otù onye tib͕uru ibe-ya, me ka ọ nwua.

7. Ma, le, ab͕uru-ha nile ebiliwo megide nwayi nējere gi ozi, ha we si, Nye ayi onye tib͕uru nwa-nne-ya, ka ayi we me ka ọ nwua n'ọnodu ndu nwa-nne-ya onye o b͕uru, ayi gēkpochapu kwa onye-nnweta ahu: ma ha gēmenyu icheku nkem nke fọduru, we ghara idoro dim aha ma-ọbu ndi fọduru n'elu uwa.

8. Eze we si nwayi ahu, La n'ulo-gi, mu onwem gēnye kwa iwu bayere gi.

9. Nwayi Tekoa ahu we si eze, N'isim, onye-nwem, eze, ka ajọ omume a di, na n'isi ulo nnam: ma ka eze na oche-eze-ya buru ndi ikpe nāmaghi.

10. Eze we si, Onye nāgwa gi okwu, me ka ọ biakutem, ọ gaghi-emetu kwa gi aka ọzọ.

11. Nwayi ahu we si, Biko, ka eze cheta Jehova, bú Chineke-gi, ka onye-ọ́bọ̀ ọbara ghara ibibi nke-uku, ka ha we ghara ikpochapu nwam nwoke. Devid we si, Jehova nādi ndu, ọ dighi otù nime agiri-isi nwa-gi gāda n'ala.

12. Nwayi ahu we si, Biko, ka nwayi nējere gi ozi gwa onye-nwem, bú eze, okwu. Ọ si, kwue.

13. Nwayi ahu we si, Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i chère ihe di otú a megide ndi Chineke? n'ihi na eze nēkwu okwu a dika onye ikpe mara, ebe eze nādighi-eme ka onye nke ya achupuru achupu lata.

14. N'ihi na ayi aghaghi inwu, ayi di kwa ka miri nke anāwusi n'ala, nke anāgaghi-achikọta; ma Chineke ewepughi ndu, kama Ọ nēchè èchìchè, ka onye achupuru achupu we ghara ibu onye achupuru n'ebe Ọ nọ.

15. Ma ub͕u a, ebe m'biaworo igwa eze, bú onye nwem, okwu a, ọ bu n'ihi na ndim emewo ka m'tua egwu; nwayi nējere gi ozi we si, Biko, ka m'gwa eze okwu; eleghi anya eze gēme okwu nke orù-ya nwayi.

16. N'ihi na eze gānu, inaputa orù-ya nwayi n'ọbu-aka nwoke nāchọ ikpochapu mu na nwam nwoke n'otù n'ihe-nketa Chineke.

17. Nwayi nējere gi ozi we si, Biko, ka okwu onye-nwem, bú eze, diri izu-ike: n'ihi na dika mọ-ozi nke Chineke, otú a ka onye-nwem, bú eze, di inu ezi ihe na ihe ọjọ: Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi.

18. Eze we za, si nwayi ahu, Biko, ezonarilam okwu nke mu onwem nāju gi. Nwayi ahu we si, Biko, ka onye-nwem, bú eze, kwue.

19. Eze we si, Àka Joab diyere gi n'ihe a nile? Nwayi ahu we za, si, Ndu nke nkpuru-obi-gi, onye-nwem, bú eze, ọ dighi onye ọ bula nēsi n'ihe ọ bula onye nwem, bú eze, kwuru, che iru n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe: n'ihi na orù-gi, bú Joab, ya onwe-ya nyerem iwu, ya onwe-ya tiye-kwa-ra okwu ndia nile n'ọnu nwayi nējere gi ozi:

20. ọ bu ichighari iru okwu a ka Joab, bú orù-gi meworo ihe a: ma onye-nwem bu onye mara ihe, dika amam-ihe nke mọ-ozi nke Chineke, ima ihe nile di n'uwa.

21. Eze we si Joab, Biko, le emewom ihe a: gi je kwa, me ka nwa-okorọbia ahu, bú Absalom, lata.

22. Joab we da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala, gọzie eze: Joab we si, Ta ka orù-gi mara na ahutawom amara n'iru-gi, onye-nwem, bú eze, ebe eze meworo okwu orù-ya.

23. Joab we bilie je Geshua, me ka Absalom bia ba na Jerusalem.

24. Eze we si, Ka o chigharia la n'ulo-ya, ma ọ gaghi-ahu irum anya. Absalom we chigharia la n'ulo-ya, ma ọ hughi iru eze.

25. Ma n'Israel nile ọ dighi nwoke mara nma dika Absalom anētò nke-uku: site n'ọbu-ukwu-ya we rue opu-n'isi-ya ọlu adighi n'aru-ya.

26. Ma mb͕e ọ kọpuru isi-ya, (n'ihi na ọ bu n'ogwugwu arọ n'ọgwugwu arọ ka ọ nākọpu ya: n'ihi na agiri-isi di arọ́ n'isi-ya, o we kọpu ya:) o we tua agiri-isi di n'isi-ya ọgu shekel iri, n'ihe-ọtùtù eze.

27. Ewe muara Absalom umu-ndikom atọ, na otù nwa-nwayi, aha-ya bu Tema: onye ahu bu nwayi mara nma ile anya.

28. Absalom we biri na Jerusalem arọ abua zuru ezu; ma ọ hughi iru eze.

29. Absalom we zigara Joab ozi, iziga ya jekuru eze; ma o kweghi ibiakute ya: O we ziga ọzọ nke ub͕ò abua, ma ọ kweghi ibia.

30. O we si ndi-orù-ya, Lenu, òkè ala-ubi Joab di n'akuku alam, o nwe-kwa-ra ọka barley n'ebe ahu: jenu, sue ya ọku. Ndi-orù Absalom we sue òkè ala-ubi ahu ọku.

31. Joab we bilie, biakute Absalom rue ulo-ya, si ya, N'ìhi gini ka ndi-orù-gi suworo òkè ala-ubim ọku?

32. Absalom we si Joab, Le, eziterem i ozi, si, Bia n'ebe a, ka m'ziga kwa gi jekuru eze, si N'ìhi gini ka m'siworo na Geshua bia? ọ gādim nma ma asi na mu onwem anọdu n'ebe ahu rue ub͕u a: ma ub͕u a ka m'hu iru eze; ọ buru kwa na ajọ omume adi nimem, ya me ka m'nwua.

33. Joab we biakute eze, gosi ya: o we kpọ Absalom, o we biakute eze, kpọ isi ala nye ya, kpuchie iru-ya n'ala n'iru eze: eze we sutu Absalom ọnu.