Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 11:5-10 Bible Nso (IGBOB)

5. Nwayi ahu we turu ime; o zìe, gosi Devid, si, Mu onwem di ime.

6. Devid we zigara Joab ozi, si, Ziterem Uraia onye Het. Joab we zigara Devid Uraia.

7. Uraia we biakute ya, Devid we jua ya ajuju bayere udo Joab, baye-kwa-ra udo ndi Israel, na otú agha nāga.

8. Devid we si Uraia, Rida n'ulo-gi, sa ukwu-gi. Uraia we si n'ulo eze pua, onyinye nri eze nyere ya we puso ya n'azu.

9. Ma Uraia dinara n'ọnu-uzọ ulo eze n'etiti ndi-orù nile nke onye-nwe-ya, ọ ridaghi kwa rue ulo-ya.

10. Ha we gosi Devid, si, Uraia aridaghi rue ulo-ya. Devid we si Uraia, Ọ̀ bughi n'ije ka gi onwe-gi si bia? gini mere i ridaghi rue ulo-gi?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 11