Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 11:18-24 Bible Nso (IGBOB)

18. Joab we ziga gosi Devid ihe nile emere n'agha ahu;

19. o we nye onye-ozi iwu, si, Mb͕e i gwabìri eze okwu agha nile,

20. o gēru kwa, ọ buru na ọnuma nke eze ebilie, o we si gi, Gini mere unu jeruru obodo ahu nso ibu agha? ùnu amaghi na ha gēsi na mb͕idi b͕a uta?

21. ònye tib͕uru Abimelek nwa Jerubeshet? nwàyi esighi na mb͕idi tua aka-nkume n'isi-ya, o we nwua na Tibez? n'ìhi gini ka unu jeruru mb͕idi nso? i gāsi kwa, Orù-gi bú Uraia onye Het, anwuwo kwa.

22. Onye-ozi ahu we je, bata, gosi Devid ihe nile Joab ji zìe ya.

23. Onye-ozi ahu we si Devid, Ndikom ahu di ike imegide ayi, we pukute ayi rue ọhia, ayi we bugide ha agha rue oghere ọnu-uzọ-ama.

24. Ndi-ọb͕a-uta we si na mb͕idi nāb͕a ndi-orù-gi uta; ufọdu n'etiti ndi-orù eze we nwua, orù-gi, bú Uraia onye Het, anwuwo kwa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 11