Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 11:15-22 Bible Nso (IGBOB)

15. O we de n'akwukwọ ahu, si, Donu Uraia na ncherita-iru agha ahu nke siri ike kari, sinu n'iso ya la azu, ka ewe tib͕ue ya, o we nwua.

16. O rue, mb͕e Joab nēche obodo nche, na o tiyere Uraia n'ebe ọ mara na ndikom bu dì-nkpà nọ.

17. Ndikom obodo we pua, buso Joab agha: ufọdu n'etiti ndi Israel we da, bú n'etiti ndi-orù Devid; Uraia onye Het nwu-kwa-ra.

18. Joab we ziga gosi Devid ihe nile emere n'agha ahu;

19. o we nye onye-ozi iwu, si, Mb͕e i gwabìri eze okwu agha nile,

20. o gēru kwa, ọ buru na ọnuma nke eze ebilie, o we si gi, Gini mere unu jeruru obodo ahu nso ibu agha? ùnu amaghi na ha gēsi na mb͕idi b͕a uta?

21. ònye tib͕uru Abimelek nwa Jerubeshet? nwàyi esighi na mb͕idi tua aka-nkume n'isi-ya, o we nwua na Tibez? n'ìhi gini ka unu jeruru mb͕idi nso? i gāsi kwa, Orù-gi bú Uraia onye Het, anwuwo kwa.

22. Onye-ozi ahu we je, bata, gosi Devid ihe nile Joab ji zìe ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 11