Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Samuel 1:21-27 Bible Nso (IGBOB)

21. Unu ugwu Gilboa,Ka igirigi ma-ọbu miri-ozuzu ghara idikwasi unu, ma-ọbu ubi nke àjà-nbuli:N'ihi na ebe ahu ka asọrọ ọta ndi-dike oyi,Ọta Sọl dika agāsi na ọ bu onye anēteghi manu.

22. Ọbara ndi eb͕uru eb͕u, abuba ndi-dike,Uta Jonatan esighi na ha la azu,Mma-agha Sọl esighi kwa lata n'efu.

23. Sọl na Jonatan bu ndi nāhurita onwe-ha n'anya, buru kwa ndi di utọ na ndu-ha,Ekewaghi kwa ha n'ọnwu-ha;Ha di garagara kari ugo,Ha di ike kari ọdum.

24. Umu-ndinyom Israel, kwaranu Sọl ákwá,Onye nēyibe unu uwe uhie, ya na ihe-utọ di iche iche,Onye nātukwasi ihe-ichọ-nma ọla-edo n'uwe-unu.

25. Ndi-dike esiwo aṅa da n'etiti agha ahu!Jonatan, n'elu ebe-gi di elu ka i buru onye eb͕uru eb͕u.

26. Anọm na nkpà n'ihi gi, nwa-nnem Jonatan:I di utọ nke-uku n'ebe m'nọ:Ihu-n'anya-gi nke i hurum di ebube,Kari ihu-n'anya ndinyom.

27. Ndi-dike esiwo aṅa da!Ihe-agha esiwo aṅa la n'iyì!

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Samuel 1