Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 9:23-35 Bible Nso (IGBOB)

23. Jehoram we chigharia aka-ya abua, b͕alaga, si Ehazaia, Aghughọ di, Ehazaia.

24. Jihu we dọtia uta-ya ka aka-ya ra, b͕ata Jehoram n'ab͕ata ogwe-aka-ya abua, àkú we si n'obi-ya puta, o we ruru ala n'ub͕ọ-ala-ya.

25. Jihu we si Bidka, bú onye-isi-agha-ya, Bulie ya, tubà n'òkè ubi Nebot, bú onye Jezreel: n'ihi na cheta na mu na gi nānọkwasi n'elu inyinya, ayi abua, nēso Ehab, bú nna-ya, mb͕e Jehova boro ya ibu a;

26. N'ezie ahuwom ọbara Nebot na ọbara umu-ya ndikom n'abali hnyahuru, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; M'gākwughachi kwa gi n'òkè-ala-ubi nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ma ub͕u a bulie ya, tubà ya n'òkè-ala-ubi ahu, dika okwu Jehova si di.

27. Ma Ehazaia, bú eze Juda, huru ya, b͕alaga n'uzọ ulo ubi ab͕ara ogige. Jihu we chuso ya, si, Tib͕u-kwa-nu ya n'ub͕ọ-ala-ya. Ha we tib͕ue ya na nrigo Gua, nke di nso Ibleam. O we b͕alaga na Megido, nwua n'ebe ahu.

28. Ndi-orù-ya we me ka ub͕ọ-ala-ya būru ya jerue Jerusalem, ha we lìe ya n'ílì-ya, n'ebe elìri nna-ya-hà, n'obodo Devid.

29. Ma n'arọ nke-iri-na-otù nke Joram nwa Ehab ka Ehazaia malitere ibu eze Juda.

30. Jihu we biarue Jezreel, Jezebel we nu ya; ọ we de ihe-ichọ-nma n'anya-ya abua, me ka isi-ya di nma, lepu anya na window.

31. Mb͕e Jihu bara n'ọnu-uzọ-ama, nwayi ahu siri, Ùdo di kwa, Zimri, ob͕u onye-nwe-ya?

32. Jihu we welie iru-ya le anya na window, si, Ònye diyerem? ònye? Onozi abua ma-ọbu atọ we leputa anya n'ebe ọ nọ.

33. Ọ si, Tudanu ya. Ha we tuda ya: ufọdu nime ọbara-ya we fesa na mb͕idi, na n'inyinya-ya: ọ we zọkwasi ya ukwu.

34. Ọ bata, rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, si, Biko, Lenu nwayi a aburu ọnu anya nke-ọma, lìe ya: n'ihi na nwa-nwayi eze ka ọ bu.

35. Ha we je ilì ya: ma ha achọtaghi ihe ọ bula di n'aru-ya ma-ọbughi okpokoro-isi-ya, na ukwu-ya abua, na ọbu-aka-ya abua.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 9