Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 9:19-24 Bible Nso (IGBOB)

19. O we zipu onye-nnọkwasi-inyinya nke-abua, ọ biakute ha, si, Otú a ka eze siri, Ùdo di kwa? Jihu we si, Gini ka gi na udo nwekọrọ? chigharia ga n'azum.

20. Onye-nche we gosi, si, Ọ biaruru ha aru, ma ọ latagh: ma odudu-inyinya di ka odudu-inyinya Jihu nwa Nimshi; n'ihi na o nēdu inyinya dika onye nāwi ara.

21. Jehoram we si, Jikwa ub͕ọ-ala. Ha we jikwa ub͕ọ-ala-ya. Jehoram, bú eze Israel, na Ehazaia, bú eze Juda, we pua, nwoke ọ bula n'ub͕ọ-ala-ya, ha we pua izute Jihu, we huta ya n'òkè-ala-ubi Nebot, bú onye Jezreel.

22. O rue, mb͕e Jehoram huru Jihu, na ọ siri, Ùdo di kwa, Jihu? Ọ si, Gini bu udo ahu, na mb͕e ikwa-iko Jezebel, bú nne-gi, na mb͕asi-ya nādi ọtutu?

23. Jehoram we chigharia aka-ya abua, b͕alaga, si Ehazaia, Aghughọ di, Ehazaia.

24. Jihu we dọtia uta-ya ka aka-ya ra, b͕ata Jehoram n'ab͕ata ogwe-aka-ya abua, àkú we si n'obi-ya puta, o we ruru ala n'ub͕ọ-ala-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 9