Jehoram we si, Jikwa ub͕ọ-ala. Ha we jikwa ub͕ọ-ala-ya. Jehoram, bú eze Israel, na Ehazaia, bú eze Juda, we pua, nwoke ọ bula n'ub͕ọ-ala-ya, ha we pua izute Jihu, we huta ya n'òkè-ala-ubi Nebot, bú onye Jezreel.