Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 9:14-19 Bible Nso (IGBOB)

14. Jihu nwa Jehoshafat nwa Nimshi we kekọta madu imegide Joram. (Ma Joram nēche Remot-gilead, ya onwe-ya na Israel nile, n'ihi Hazael, bú eze Siria:

15. ma Jehoram, bú eze, laghachiri ka agwọ ya nime Jezreel na ntib͕u nke ndi Siria tib͕uru ya, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha.) Jihu we si, Ọ buru na nka bu uche-unu, ka onye-nb͕apu ghara isi n'obodo a pua ije igosi ya nime Jezreel.

16. Jihu we nọdu n'ub͕ọ-ala, jerue Jezreel; n'ihi na Joram nēdina n'ebe ahu. Ma Ehazaia, bú eze Juda, ridatara ihu Joram.

17. Ma onye-nche nēguzo n'elu ulo-elu na Jezreel, ọ hu ìgwè ndi Jihu mb͕e ọ nābia, ọ si, Ìgwè madu ka m'nāhu. Jehoram we si, Were onye-inyinya, ziga izute ha, ya si kwa, Ùdo di kwa?

18. Onye-nnọkwasi-inyinya we je izute ya, si, Otú a ka eze siri. Ùdo di kwa? Jihu we si, Gini ka gi na udo nwekọrọ? chigharia ga n'azum. Onye-nche ahu we gosi, si, Onye-ozi-ayi biakutere ha, ma ọ lataghi.

19. O we zipu onye-nnọkwasi-inyinya nke-abua, ọ biakute ha, si, Otú a ka eze siri, Ùdo di kwa? Jihu we si, Gini ka gi na udo nwekọrọ? chigharia ga n'azum.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 9