Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 8:14-26 Bible Nso (IGBOB)

14. O we si n'ebe Elaisha nọ la, biakute onye-nwe-ya; ọ si ya, Gini ka Elaisha siri gi? Ọ si, Ọ sirim na i ghaghi idiri ndu.

15. O rue, n'echi-ya, na ọ chiri ákwà-ob͕ub͕o, biaye na miri, b͕asa ya n'iru-ya, ọ we nwua: Hazael we buru eze n'ọnọdu ya.

16. Ma n'arọ nke-ise nke Joram nwa Ehab, bú eze Israel, mb͕e Jehoshafat bu kwa eze Juda, Jehoram nwa Jehoshafat, bú eze Juda, malitere ibu eze.

17. Orú arọ na iri na abua ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ astọ na Jerusalem.

18. Ọ je ije n'uzọ ndi-eze Israel, dika ulo Ehab mere: n'ihi na ọ bu nwa-nwayi Ehab ka o nwere na nwunye: o we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.

19. Ma Jehova ekweghi ibibi Juda, n'ihi Devid, bú orù-Ya, dika Ọ siri ya na Ọ gēnye ya oriọna, nye kwa umu-ya, ubọchi nile.

20. N'ubọchi-ya ka Edom siri n'okpuru aka Juda jehie, mere onwe-ha eze.

21. Joram we gabiga rue Zaia, ya na ub͕ọ-ala-ya nile: o rue na o biliri n'abali, tib͕ue Edom ndi nāb͕a ya buruburu, ha na ndi-isi ub͕ọ-ala: ndi ahu we b͕alaga n'ulo-ikwū-ha.

22. Edom we si n'okpuru aka Juda jehie, rue ta. Mb͕e ahu ka Libna jehiere n'otù mb͕e ahu.

23. Ma okwu Joram nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?

24. Joram we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: Ehazaia, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.

25. N'arọ nke-iri-na-abua nke Joram nwa Ehab, bú eze Israel, ka Ehazaia nwa Jehoram, bú eze Juda, malitere ibu eze.

26. Orú arọ na abua ka Ehazaia b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze otù arọ na Jerusalem. Ma aha nne-ya bu Atalaia nwa Ọmri, bú eze Israel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 8