Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 6:15-27 Bible Nso (IGBOB)

15. Onye nējere onye nke Chineke ozi we bilie n'isi-ututu, pua, ma, le, usu-ndi-agha nāb͕a obodo ahu buruburu, ha na inyinya na ub͕ọ-ala. Nwa-okorọbia-ya we si ya, Ewó, onye-nwem! àyi gēme aṅa?

16. Ọ si, Atula egwu: n'ihi na ndi ayi na ha nọ di ọtutu kari ndi ha na ha nọ.

17. Elaisha we kpe ekpere, si, Jehova, biko, saghe anya-ya abua, ka ọ we hu. Jehova we saghe anya nwa-okorọbia ahu; o we hu: ma, le, ugwu ahu juputara n'inyinya na ub͕ọ-ala ọku buruburu Elaisha.

18. Ha we ridakute ya, Elaisha we kpere Jehova, si, Biko, were ìsì tie mba nka. O we were ìsì tie ha dika okwu Elaisha si di.

19. Elaisha we si ha, Nka abughi uzọ, nka abughi kwa obodo; sonum je, m'gēme kwa ka unu jekuru nwoke ahu onye unu nāchọ. O we me ka ha je Sameria.

20. O rue, mb͕e ha bara na Sameria, na Elaisha siri, Jehova, saghe anya ndikom ndia, ka ha we hu. Jehova we saghe anya-la, ha we hu; ma, le, ha nọ n'etiti Sameria.

21. Eze Israel we si Elaisha, mb͕e ọ huru ha, Nnam, #m'gētib͕u ha? #m'gētib͕u ha?

22. Ọ si, Etib͕ula ha: ì gētib͕u ndi i wereworo mma-agha-gi, were kwa uta-gi, dọta n'agha? dọba nri na miri n'iru ha, ka ha we rie, ṅu kwa, lakuru onye-nwe-ha.

23. O we mere ha oké oriri: ha we rie, ṅu kwa, o we zilaga ha, ha we lakuru onye-nwe-ha. Ma usu ndi nāpunara madu ihe nke Siria abataghi ọzọ n'ala Israel.

24. O rue, mb͕e nka gasiri, na Ben-hedad, bú eze Siria, chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, rigo, nọchigide Sameria n'agha.

25. Oké unwu uku we di na Sameria: ma, le, ha nānọchigide ya n'agha, rue mb͕e anēre isi inyinya-ibu ọgu ọla-ọcha anọ na otù uzọ n'uzọ anọ nke otù kab ǹsí nduru ọla-ọcha ise.

26. O rue, mb͕e eze Israel nāgabiga n'elu mb͕idi, na otù nwayi tikuru ya nkpu, si, Zọputa, onye-nwem eze.

27. Ọ si, Ọ buru na Jehova azọputaghi gi, òle ebe m'gēsi zọputa gi? ọ̀ bu site n'ebe-nzọcha-ọka, ma-ọbu site n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 6