Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 3:20-27 Bible Nso (IGBOB)

20. O rue n'ututu, na, mb͕e anēsure onyinye-inata-iru-ọma, le, miri nēsi n'uzọ Edom bia, ala we juputa na miri.

21. Moab nile we nu na ndi-eze ahu arigotawo ibuso ha agha, ha we kpọkọta onwe-ha, site n'onye ọ bula nke nēke onwe-ya ihe-ọkiké agha n'úkwù, we rigorue ndi bu okenye, ha we guzo n'ókè-ala-ha.

22. Ha we bilie n'isi-ututu, ma anyanwu mukwasiri miri ahu, Moab we hu miri ahu na ncherita-iru ha ka ọ nācha ọbara dika ọbara:

23. ha we si, Nka bu ọbara; ekpochapuwo ndi-eze ahu nọ̄, ha etib͕uwo kwa, nwoke ọ bula ibe-ya: ma ub͕u a, Moab, kwatanu ihe-nkwata.

24. Ha biarue ọmuma-ulo-ikwū Israel, Israel we bilie, tib͕ue Moab, ha we si n'iru ha b͕alaga: ha we ba nime ya nētib͕u Moab.

25. Ha we tipia obodo nile ha; ha nātubà kwa, nwoke ọ bula nkume-ya, n'ezi òkè ala-ubi ọ bula, tujue ya; ha nēkpochi kwa isi-iyi miri nile, me ka ezi osisi nile da: rue mb͕e ọ bu nání na Kia-hareset ka emere ka nkume-ya fọdu; ma ndi-ọma-èbè b͕ara ya buruburu, tib͕ue ya.

26. Eze Moab we hu na agha ahu di ike kari ya, o we chiri nnù ndikom na ọgu iri-na-ise tiyere onwe-ya, bú ndi nāmiputa mma-agha, itiwaru eze Edom:

27. O we were ọkpara-ya, nke gābu eze n'ọnọdu ya, sure ya ọku n'elu mb͕idi, ka ọ buru àjà-nsure-ọku. Oké iwe we di megide Israel: ha we si n'ebe ọ nọ bulie ije, laghachi n'ala-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 3