Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 25:6-13 Bible Nso (IGBOB)

6. Ha we jide eze, me ka ọ rigokuru eze Babilon rue Ribla; ha we kwue okwu ikpé n'ebe ọ nọ.

7. Ha we b͕ue umu-ndikom Zedekaia n'anya-ya, Nebukadneza me-kwa-ra ka Zedekaia kpue ìsì n'anya-ya abua, ha were kwa ihe-ọla eji ke ukwu ke ya ab͕u, ha we me ka ọ ba na Babilon.

8. Ma n'ọnwa nke-ise, n'ubọchi nke-asa nke ọnwa ahu, nke ahu bu arọ nke-iri-na-iteghete nke eze, bú Nebukadneza, eze Babilon, ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, orù eze Babilon, biaruru Jerusalem:

9. o sure ulo Jehova ọku, na ulo eze; ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem, bú ulo uku ọ bula, ka o surere n'ọku.

10. Usu-ndi-agha nile nke ndi Kaldea, ndi soro onye-isi ndi-ob͕ū, kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem buruburu.

11. Ma ndi ala ahu nke fọduru, bú ndi fọduru n'obodo, na ndi dapuru adapu, bú ndi dapuru jekuru eze Babilon, na ndi fọduru n'etiti igwè madu, ndia ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha je biri n'ala ọzọ.

12. Ma ufọdu nime ndi ala ahu ndi nēnweghi ike ka onye-isi ndi-ob͕ū mere ka ha fọdu ibu ndi-ọlu-ubi-vine na ibu ndi-ọlụ-ubi.

13. Ma ogidi ọla nile nke di n'ulo Jehova, na ihe-ndọkwasi nile na oké osimiri ọla nke di n'ulo Jehova, ndia ka ndi Kaldea tipiara, chiri ọla-ha je Babilon.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 25