Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 21:11-21 Bible Nso (IGBOB)

11. N'ihi na Manase, bú eze Juda, emewo ihe-árú ndia, we me ihe ọjọ kari ihe nile nke ndi-Amorait mere, ndi buru ya uzọ, o we were arusi-ya nile me ka Juda mehie kwa:

12. n'ihi ya otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ biakwasi Jerusalem na Juda, nke nti abua nke onye ọ bula nānu gāzu wuruwuru.

13. M'gēseti kwa n'elu Jerusalem eriri Sameria na ihe-ọtùtù ulo Ehab: M'gēhicha kwa Jerusalem dika madu si ehicha ọkwa, nēhicha ya, nēkpùta ya iru.

14. M'gārapu kwa ndi fọduru nke ihe-nketam, nye ha n'aka ndi-iro-ha; ha gāghọ-kwa-ra ndi-iro-ha nile ihe-nluta-n'agha na ihe ha nānara n'ike;

15. n'ihi na ha emewo ihe jọrọ njọ n'anyam, ha nākpasukwam ìwe, site n'ubọchi ndi bu nna-ha siri n'Ijipt puta, we rue ta.

16. Ọzọ kwa, Manase wusiri ọbara nke-uku ri nne, bú nke nēmeghi ihe ọjọ, rue mb͕e o mejuru Jerusalem site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ; nāgughi nmehie-ya nke o jiri me ka Juda mehie, ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.

17. Ma okwu Manase nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na nmehie-ya nke o mehiere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?

18. Manase we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ubi ulo-ya ab͕ara ogige, n'ubi Uza ab͕ara ogige: Emon nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

19. Emon b͕ara orú arọ na abua mb͕e o malitere ibu eze; o we buru eze arọ abua nime Jerusalem: aha nne-ya bu Meshulemet nwa Haruz nke Jọtba.

20. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika Manase, bú nna-ya, mere.

21. O we je ije n'uzọ nile nke nna-ya jere, o we fè arusi òfùfè nke nna-ya fère, ọ kpọ isi ala nye ha:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 21