Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 21:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Manase b͕ara arọ iri na abua mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na iri na ise nime Jerusalem: aha nne-ya bu Hefzi-ba.

2. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.

3. Ebe di elu nke Hezekaia nna-ya mere ka ha la n'iyì, o wue ha ọzọ; o guzo-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye Beal, me kwa Ashera, dika Ehab, bú eze Israel, mere, ọ kpọ isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè ha òfùfè.

4. O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà di iche n'ulo Jehova, nke Jehova siri, Nime Jerusalem ka M'gētiye aham.

5. O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye usu nile nke ihe elu-igwe n'ogige abua nke ulo Jehova.

6. O me-kwa-ra ka nwa-ya mwoke gabiga nime ọku, o ji-kwa-ra igwe-oji tu isi ọma na isi ọjọ, ọ b͕a-kwa-ra afa, meso kwa onye nāju mọ ihe, na ndi-dibia-afa: o mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova ri nne, ikpasu Ya iwe.

7. Ọ dọba-kwa-ra arusi apiri api nke Ashera, bú nke o mere, n'ulo ahu nke Jehova siri Devid, si kwa Solomon nwa-ya, N'ulo a, na nime Jerusalem, nke M'rọputaworo n'ebo nile nke Israel, ka M'gētiye aham rue mb͕e ebighi-ebi:

8. M'gaghi-eme kwa ka ukwu Israel si n'ala nke M'nyere ndi bu nna-ha waghari ọzọ; nání ọ buru na ha elezi anya ime dika ihe nile si di nke M'nyeworo ha n'iwu, na dika iwu nile si di nke orùm, bú Moses, nyēre ha n'iwu.

9. Ma ha anugh: Manase we me ka ha sihie uzọ ime ihe ọjọ kari mba ọzọ, bú ndi Jehova kpochapuru n'iru umu Israel.

10. Jehova we kwue site n'aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma, si,

11. N'ihi na Manase, bú eze Juda, emewo ihe-árú ndia, we me ihe ọjọ kari ihe nile nke ndi-Amorait mere, ndi buru ya uzọ, o we were arusi-ya nile me ka Juda mehie kwa:

12. n'ihi ya otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ biakwasi Jerusalem na Juda, nke nti abua nke onye ọ bula nānu gāzu wuruwuru.

13. M'gēseti kwa n'elu Jerusalem eriri Sameria na ihe-ọtùtù ulo Ehab: M'gēhicha kwa Jerusalem dika madu si ehicha ọkwa, nēhicha ya, nēkpùta ya iru.

14. M'gārapu kwa ndi fọduru nke ihe-nketam, nye ha n'aka ndi-iro-ha; ha gāghọ-kwa-ra ndi-iro-ha nile ihe-nluta-n'agha na ihe ha nānara n'ike;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 21