Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 2:14-19 Bible Nso (IGBOB)

14. O we chiri uwe-nwuda Elaija, nke danariri ya, o we tie miri, si, Òle ebe Jehova nọ, bú Chineke Elaija? Ya onwe-ya kwa, o we tie miri, ewe kera ya otù uzọ ga n'otù akuku, otù uzọ ga n'akuku ọzọ; Elaisha we gabiga.

15. Umu ndi-amuma ndi nọ na Jeriko na ncherita-iru ya we hu ya, si, Mọ Elaija anọkwasiwo Elaisha. Ha we bia izute ya, ha we kpọrọ ya isi ala.

16. Ha we si ya, Biko, le, ọgu ndikom abua na iri, bú ndi-dìnkpà, nọ n'etiti ndi-orù-gi n'ebe a; biko, ka ha je, chọ onye-nwe-gi: eleghi anya Mọ nke Jehova eweliwo ya, tuda ya n'otù ugwu, ma-ọbu n'otù ndagwurugwu. Ọ si, Unu ezigala.

17. Ha we rugide ya rue mb͕e ihere mere ya, o we si, Ziganu. Ha we ziga ọgu ndikom abua na iri; ha we chọ ya ubọchi atọ, ma ha achọtaghi ya.

18. Ha we laghachikuru ya, ma ya onwe-ya nānọ na Jeriko; ọ si ha, Àsighm unu, Ejela?

19. Ndikom obodo ahu we si Elaisha, Biko, le, ọnọdu obodo a di nma, dika onye-nwem nāhu: ma miri-ya jọrọ njọ, ala nādighi-ekwe kwa ka ihe ka aka.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 2