Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 17:35-41 Bible Nso (IGBOB)

35. Jehova we soro ha b͕a ndu, nye ha iwu, si, Unu atula egwu chi di iche iche ọzọ, unu akpọ-kwa-la isi ala nye ha, unu efè-kwa-la ha òfùfè, unu achu-kwara-la ha àjà:

36. kama Jehova, Onye were ike uku na ogwe-aka esetiri eseti me ka unu si n'ala Ijipt rigoputa, Ya ka unu gātu egwu, Ya ka unu gākpọ kwa isi ala nye, Ya ka unu gāchu-kwa-ra àjà:

37. ukpuru nile na ikpé nile na iwu na ihe enyere n'iwu, nke O dere n'akwukwọ nye unu, ndia ka unu gēlezi kwa anya ime ubọchi nile; ma unu atula egwu chi di iche iche ọzọ:

38. ma ọb͕ub͕a-ndu Mu na unu b͕ara, unu echezọla ya; unu atu-kwa-la egwu chi di iche iche ọzọ:

39. kama Jehova, bú Chineke-unu, ka unu gātu egwu; Ya onwe-ya gānaputa kwa unu n'aka ndi-iro-unu nile.

40. Ma ha anughi, kama dika ikpé mbu ha si di ka ha onwe-ha nēme.

41. Mba ndia we nātu egwu Jehova, ma ọ bu arusi nile ha apiri api ka ha nēfè; umu-ha kwa, na umu umu-ha, dika ndi bu nna-ha mere, otú a ka ha onwe-ha nēme rue ta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 17