Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 17:24-39 Bible Nso (IGBOB)

24. Eze Asiria we me ka madu si na Babilon, si kwa na Kuta, si Kwa n'Ava, si kwa na Hemat na Sefavaim, bia, o me ka ha biri n'obodo nile nke Sameria n'ọnọdu umu Israel: ha we nweta Sameria, biri n'obodo-ya nile.

25. O rue, na nmalite obibi-ha n'ebe ahu, na ha atughi egwu Jehova: Jehova we zìe ọdum n'etiti ha, ha we nēb͕u ufọdu nime ha.

26. Ha we gwa eze Asiria okwu, si, Mba ndi i mere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi i mere ka ha biri n'obodo Sameria, ha amaghi ikpé Chineke nke ala ahu: O we zìe ọdum n'etiti ha, ma, le, ha nēme ka ha nwua, n'ihi na ha amaghi ikpé Chineke nke ala ahu.

27. Eze Asiria we nye iwu, si, Me ka otù onye nime ndi-nchu-àjà je n'ebe ahu, bú ndi unu mere ka ha si n'ebe ahu je biri n'ala ọzọ; ka ha je kwa biri n'ebe ahu, ka o zí kwa ha ikpé Chineke ala ahu:

28. Otù onye nime ndi-nchu-àjà ahu ndi ha mere ka ha si na Sameria je biri n'ala ọzọ we bia biri na Bet-el, we nēzí ha otú ha gātu egwu Jehova.

29. Ha we nēme, mba ọ bula chi nke aka ya, ha we dọba ha n'ulo nke ebe di elu nke ndi Sameria mere, mba ọ bula n'obodo-ha ebe ha onwe-ha nēbi.

30. Ndikom Babilon we me Sukot-benot, ndikom Kut me-kwa-ra Neagal, ndikom Hemat me-kwa-ra Ashima,

31. ndikom Ava me-kwa-ra Nibaz na Tatak, ma ndi Sefavaim nēsurere Adramelek na Anamelek umu-ha n'ọku, bú chi abua nke Sefavaim.

32. Ha we nātu egwu Jehova, mere onwe-ha ndi-nchu-àjà nke ebe nile di elu sitere n'ọnu-ọgugu-ha nile, ha we nēmere ha ihe n'ulo nke ebe nile di elu.

33. Jehova ka ha nātu egwu, ma chi di iche iche nke aka ha ka ha nēfè, dika ikpé mba nile si di, bú ndi emere ka ha si n'ebe ahu je biri n'ala ọzọ.

34. Rue ta ndi ahu nēme dika ikpé mbu nile si di: ha adighi-atu egwu Jehova, ha adighi-eme kwa dika ukpuru nile ha si di, ma-ọbu dika ikpé-ha si di, ma-ọbu dika iwu si di, ma-ọbu dika ihe enyere n'iwu si di, nke Jehova nyere umu Jekob n'iwu, bú onye Ọ guru aha-ya Israel;

35. Jehova we soro ha b͕a ndu, nye ha iwu, si, Unu atula egwu chi di iche iche ọzọ, unu akpọ-kwa-la isi ala nye ha, unu efè-kwa-la ha òfùfè, unu achu-kwara-la ha àjà:

36. kama Jehova, Onye were ike uku na ogwe-aka esetiri eseti me ka unu si n'ala Ijipt rigoputa, Ya ka unu gātu egwu, Ya ka unu gākpọ kwa isi ala nye, Ya ka unu gāchu-kwa-ra àjà:

37. ukpuru nile na ikpé nile na iwu na ihe enyere n'iwu, nke O dere n'akwukwọ nye unu, ndia ka unu gēlezi kwa anya ime ubọchi nile; ma unu atula egwu chi di iche iche ọzọ:

38. ma ọb͕ub͕a-ndu Mu na unu b͕ara, unu echezọla ya; unu atu-kwa-la egwu chi di iche iche ọzọ:

39. kama Jehova, bú Chineke-unu, ka unu gātu egwu; Ya onwe-ya gānaputa kwa unu n'aka ndi-iro-unu nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 17