Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 17:17-31 Bible Nso (IGBOB)

17. Ha me-kwa-ra ka umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom gabiga nime ọku, ha nāju kwa ase, nāb͕a afa, re onwe-ha ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe.

18. Jehova we wesa Israel iwe nke-uku, si n'iru Ya wezuga ha: ọ dighi ndi fọduru, nābughi ebo Juda, nání ya.

19. Juda edebeghi kwa ihe nile Jehova, bú Chineke-ha, nyere n'iwu, kama ha jeghariri n'ukpuru nile nke Israel nke ha mere.

20. Jehova we ju nkpuru nile nke Israel, weda ha n'ala, nye ha n'aka ndi nāpunara madu ihe, rue mb͕e O siri n'iru Ya chupu ha.

21. N'ihi na Ọ dọwapuru Israel n'ulo Devid; ha we me Jeroboam nwa Nebat eze: Jeroboam we chuputa Israel n'iso Jehova, o we me ka ha mehie nmehie uku.

22. Umu Israel we jegharia nime nmehie nile nke Jeroboam, nke o mere; ha esighi nime ha wezuga onwe-ha;

23. rue mb͕e Jehova siri n'iru Ya wezuga Israel, dika O kwuru site n'aka ndi-orù-Ya nile, bú ndi-amuma. Ewe me ka Israel si n'elu ala-ha je biri n'Asiria, rue ta.

24. Eze Asiria we me ka madu si na Babilon, si kwa na Kuta, si Kwa n'Ava, si kwa na Hemat na Sefavaim, bia, o me ka ha biri n'obodo nile nke Sameria n'ọnọdu umu Israel: ha we nweta Sameria, biri n'obodo-ya nile.

25. O rue, na nmalite obibi-ha n'ebe ahu, na ha atughi egwu Jehova: Jehova we zìe ọdum n'etiti ha, ha we nēb͕u ufọdu nime ha.

26. Ha we gwa eze Asiria okwu, si, Mba ndi i mere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi i mere ka ha biri n'obodo Sameria, ha amaghi ikpé Chineke nke ala ahu: O we zìe ọdum n'etiti ha, ma, le, ha nēme ka ha nwua, n'ihi na ha amaghi ikpé Chineke nke ala ahu.

27. Eze Asiria we nye iwu, si, Me ka otù onye nime ndi-nchu-àjà je n'ebe ahu, bú ndi unu mere ka ha si n'ebe ahu je biri n'ala ọzọ; ka ha je kwa biri n'ebe ahu, ka o zí kwa ha ikpé Chineke ala ahu:

28. Otù onye nime ndi-nchu-àjà ahu ndi ha mere ka ha si na Sameria je biri n'ala ọzọ we bia biri na Bet-el, we nēzí ha otú ha gātu egwu Jehova.

29. Ha we nēme, mba ọ bula chi nke aka ya, ha we dọba ha n'ulo nke ebe di elu nke ndi Sameria mere, mba ọ bula n'obodo-ha ebe ha onwe-ha nēbi.

30. Ndikom Babilon we me Sukot-benot, ndikom Kut me-kwa-ra Neagal, ndikom Hemat me-kwa-ra Ashima,

31. ndikom Ava me-kwa-ra Nibaz na Tatak, ma ndi Sefavaim nēsurere Adramelek na Anamelek umu-ha n'ọku, bú chi abua nke Sefavaim.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 17