Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 15:8-15 Bible Nso (IGBOB)

8. N'arọ nke-orú-na-iri-na-asatọ nke Azaraia, bú eze Juda, ka Zekaraia nwa Jeroboam malitere ibu eze Israel nime Sameria ọnwa isi.

9. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova dika nna-ya-hà mere: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie.

10. Shalum nwa Jedesh we kekọta madu imegide ya, tib͕ue ya n'iru ndi Israel, me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya.

11. Ma ihe Zekaraia mere nke fọduru, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel.

12. Nka bu okwu Jehova, nke Ọ gwara Jihu, si, Umu-gi ndikom nke umu-umu nke-anọ gānọkwasiri gi n'oche-eze Israel. O we di otú a.

13. Shalum nwa Jebesh malitere ibu eze n'arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete nke Uzaia, bú eze Juda; o we buru eze ogologo otù ọnwa nime Sameria.

14. Menahem nwa Gadi we si na Tiaza rigo, biarue Sameria, tib͕ue Shalum nwa Jebesh nime Sameria, me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya.

15. Ma ihe nile Shalum mere nke fọduru, na nkekọta-ya nke ọ kekọtara madu imegide eze, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 15