Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 14:20-29 Bible Nso (IGBOB)

20. Ha we bute ya n'elu inyinya: ewe lìe ya nime Jerusalem n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid.

21. Ndi nile nke Juda we were Azaraia, ma onye ahu b͕ara arọ iri na isi, ha we me ya eze n'ọnọdu nna-ya Amazaia.

22. Ya onwe-ya wuru Ilat, nyeghachi ya Juda, mb͕e eze sorosiri nna-ya-hà dina n'ọnwu.

23. N'aro nke-iri-na-ise nke Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, ka Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel, malitere ibu eze na Sameria ọgu arọ abua na otù.

24. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie.

25. Onye ahu weghachiri ókè-ala Israel site na nbata Hemat rue oké osimiri Araba, dika okwu Jehova, bú Chineke Israel, si di, nke O kwuru site n'aka Jona nwa Amitai, bú onye-amuma, nke sitere na Gat-hefa.

26. N'ihi na Jehova huru nweda-n'ala nke Israel, na ọ di ilu nke-uku: ọ dighi kwa onye eb͕ochiri eb͕ochi ma-ọdu onye arapuru fọduru, ọ dighi kwa onye-iye-aka ọ bula Israel nwere.

27. Ma Jehova ekwughi na Ọ gēhichapu aha Israel n'okpuru elu-igwe: O we si n'aka Jeroboam nwa Joash zọputa ha.

28. Ma okwu Jeroboam nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya, otú o buru agha, otú o weghachi-kwa-ra Damaskọs, na Hemat, nke Juda nwere, nye Israel, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?

29. Jeroboam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, bú ndi-eze Israel; Zekaraia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 14