Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 14:11-19 Bible Nso (IGBOB)

11. Ma Amazaia anughi. Jehoash, bú eze Israel, we rigo; ya onwe-ya na Amazaia, bú eze Juda, we lerita onwe-ha anya n'iru na Bet-shemesh, nke Juda nwere.

12. Ewe tib͕ue Juda n'iru Israel; ha we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ulo-ikwū-ya.

13. Jehoash, bú eze Israel, we jide Amazaia, bú eze Juda, nwa Jehoash nwa Ehazaia, nime Bet-shemesh, we biarue Jerusalem, tipue mb͕idi Jerusalem site n'ọnu-uzọ-ama Efraim rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, nnù cubit.

14. Ọ chiri ọla-edo na ọla-ọcha nile, na ihe nile ahutara n'ulo Jehova, na n'àkù nile nke ulo eze, na ndi edoro na mbe, o we laghachi na Sameria.

15. Ma ihe Jehoash nile nke fọduru, nke o mere, na idi-ike-ya, na otú o busoro Amazaia, bú eze Juda, agha èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?

16. Jehoash we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya nime Sameria n'ebe elìri ndi-eze Israel; Jeroboam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

17. Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, we di ndu mb͕e ọnwu Jehoash nwa Jehoahaz, bú eze Israel, gasiri, arọ iri na ise.

18. Ma ihe nile nke Amazaia mere nke fọduru, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?

19. Ha we kekọta nkekọta-madu megide ya nime Jerusalem; o we b͕alaga na Lekish: ha we ziga ichuso ya rue Lekish, me ka ọ nwua n'ebe ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 14