Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 7:4-17 Bible Nso (IGBOB)

4. Eze na ndi Israel nile nāchu kwa àjà n'iru Jehova.

5. Eze, bú Solomon, we chua àjà, bú orú nnù ehi uzọ abua na nnù iri-na-ise, na orú nnù aturu uzọ iri-na-ise. Eze na ndi Israel nile we ra ulo Chineke nye Chineke.

6. Ndi-nchu-àjà nēguzo kwa, dika ihe-ndebe-ha si di; ha na ndi Livai, ndi chiri ihe abù Jehova, nke Devid, bú eze, mere ikele Jehova, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di, mb͕e Devid nēto Chineke site n'aka-ha: ndi-nchu-àjà nāfù kwa opì n'iru ha; Israel nile nēguzo kwa.

7. Solomon we do etiti ogige nke di n'iru ulo Jehova nsọ; n'ihi na ọ churu àjà-nsure-ọku na abuba àjà-udo n'ebe ahu: n'ihi na ebe-ichu-àjà ọla nke Solomon mere apughi inagide àjà-nsure-ọku, na onyinye-inata-iru-ọma, na abuba ahu.

8. Solomon we me ememe na mb͕e ahu ubọchi asa, ya na Israel nile, oké nkpọkọta uku, site na nbata Hemat rue miri-iyi Ijipt.

9. Ha we me ememe nb͕ochi n'ubọchi nke-asatọ: n'ihi na ha mere ememe ira ebe-ichu-àjà nye Chineke ubọchi asa, me kwa ememe ahu ubọchi asa.

10. N'ubọchi nke-orú-na-atọ nke ọnwa nke-asa o we zilaga ndi Israel n'ulo-ikwū-ha, ha nāṅuri ọṅu, obi di kwa ha nma, n'ihi ezi ihe nke Jehova mere Devid, me-kwa-ra Solomon, me-kwa-ra Israel, bú ndi-Ya.

11. Solomon we wubìe ulo Jehova, na ulo eze: ma ihe nile nke batara n'obi Solomon ime n'ulo Jehova na n'ulo-ya, o mere ka ha ga nke-ọma.

12. Jehova we me ka Solomon hu Ya anya n'abali, Ọ si ya, Anuwom ekpere-gi, rọputa-kwa-ra Onwem ebe a ibu ulo ichu àjà.

13. Asi na eb͕ochim elu-igwe, miri-ozuzo we ghara idi, ma-ọbu asi na enyem igurube iwu iripia ala, ma-ọbu asi na ezitem ajọ ọria nēfe efe n'etiti ndim;

14. ọ buru na ndim, bú ndi akpọkwasiri ha aham, eweda onwe-ha n'ala, kpe ekpere, chọ irum, si n'uzọ ọjọ ha nile laghachi; Mu onwem gēsi kwa n'elu-igwe nuru, b͕aghara ha nmehie-ha, me ka ala-ha diri ndu.

15. Ub͕u a anyam abua ganāsaghe, ntim abua ganāṅa kwa nti, n'ekpere nke ebe a.

16. Ma ub͕u a arọputawom ulo a, do kwa ya nsọ, ka aham we di n'ebe ahu rue mb͕e ebighi-ebi: anyam abua na obim gādi kwa n'ebe ahu ubọchi nile.

17. Ma gi onwe-gi, ọ buru na i jegharia n'irum, dika Devid, bú nna-gi, jeghariri, ọbuná ime dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu, ọ buru na i debe ukpurum nile na ikpém nile;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 7