Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 35:6-12 Bible Nso (IGBOB)

6. B͕u-kwa-nu anu ngabiga, do kwa onwe-unu nsọ, dozi-kwa-ra umu-nne-unu ihe, ime dika okwu Jehova, site n'aka Moses, si di.

7. Josaia we bulie nye umu ndi Israel, bú ndi nile ahuru n'ebe ahu, ìgwè ewu na aturu, bú umu-aturu na umu-ewu, ha nile bu iji chu àjà-ngabiga, ọnu-ọgugu-ha ra ka orú nnù uzọ atọ na nnù iri-na-ise, na nnù oké-ehi asa na ọgu iri: ndia sitere n'àkù eze.

8. Ndi-isi-ya buli-kwa-ra onyinye-afọ-ofufo nye ndi ahu, bú ndi-nchu-àjà na ndi Livai. Hilkaia na Zekaraia na Jehiel, bú ndi-ndú ulo Chineke, nyere ndi-nchu-àjà nnù ewu na aturu isi na ọgu iri, na ọgu ehi iri-na-isi, iji chu àjà-ngabiga.

9. Konanaia kwa, na Shemaia na Netanel, bú umu-nne-ya, na Hashabaia na Jeiel na Jozabad, bú ndi-isi nke ndi Livai, buliri nye ndi Livai nnù ewu na aturu iri-na-abua na ọgu iri, na nnù ehi na ọgu ise, iji chu àjà-ngabiga.

10. Ewe dozie òfùfè ahu, ndi-nchu-àjà we guzo n'ebe-nguzo-ha, na ndi Livai n'òkè nile ha, dika ihe eze nyere n'iwu si di.

11. Ha we b͕ue anu ngabiga ahu, ndi-nchu-àjà we wusa ọbara nke ha natara n'aka-ha, ndi Livai we nāb͕a akpukpọ-ha.

12. Ha we wezuga àjà-nsure-ọku, inye ha dika nkewa nile nke ulo nke ndi bu nna umu ndi Israel si di, iweta ha nso Jehova, dika edeworo ya n'akwukwọ Moses. Otú a ka eme-kwa-ra ehi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 35